INEC akọwaala ihe o jiri wepụ aha ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na ndekọ ikpeazụ

Inec kwuru na ndị aha ha adịghị ya bụ ndị pati ha dara iwu na-echekwa ndekọ aha ndị na-azọ ọchịchị na ntuliaka.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec), akọwaala na o wepụrụ aha ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'ihi na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha dara iwu metụtara iwete ndekọ aha ndị otu ha.

N'ozi Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ Inec bụ Malam Mohammed Kudu Haruna wepụtara n'ụbọchị Wenezde 14 Ọktoba 2026.

Inec sị na nke a na-eso mkpebi ụlọikpe ukwu mere n'ụbọchi 24 Sepụtemba 2026, nke kwadoro iwu siri ka otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nye Inec ndekọ aha ndị otu ha tupu ha e nwee ike ime ntuliaka ime ụlọ.

N'ozi ahụ, Inec kwuru na ikpe ahụ metụtara mkpegharị ikpe e mere n'Ụlọikpe ukwu gbasara ikpe dị n'etiti ha na otu 'Zenith Labour Party'.

Ụlọikpe ahụ rụrụ aka na akụkụ iwu ntuliaka 77(5) ruo na 77(7) nke afọ 2026, nke manyere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị niile ka ha rube isi n'nye Inec ndekọ aha ndị otu ha site na 21 Eprelụ ruo 10 Mee 2026.

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla dara iwu a, agaghị enwe ikike itinye onye ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa na ntuliaka.

Inec kwuru na o tinyere mkpebi ụlọikpe ahụ n'ọrụ mgbe ọ na-edepụta aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ, site n'iwepụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị na-emezughi iwu ahụ.

Inec gwara otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị na-eche na e wepụrụ ndị ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa n'ụzọ na-ezighị ezi, na ha nwere ụbọchị 14 site n'ụbọchị e bipụtara aha ahụ iji mee mkpesa.

Ha kwuru na ụbọchị ikpeazụ maka ime nke a bụ 24 Ọktoba 2026.

Aha Pantami, Adebutu na ndị ọzọ anọghị n'akwụkwọ Inec

Foto Isa Pantami, bụbu Minista na-ahụ maka mgbasaozi nakwa "Digital Economy, na-azọ ọkwa Gọvanọ Gombe state, Oladipupo Adebutu na-azọ ọkwa Gọvanọ Ogun state, Aminu Gwarzo na-azọ ọkwa Gọvanọ Kano state

Dịka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) na-ahụ maka ntuliaka na Nigeria wepụtara aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka 2027, akụkọ ekwuola na aha ọtụtụ ndị a ma ama adịghị na ndekọ akwụkwọ na-egosi ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ.

N'ihi aha ndị a, gbata gbata adaala na ọtụtụ pati ugbua, ebe ụfọdụ ṅụrụ iyi na ha ga-eme ihe niile ịhụ na ụlọọrụ Inec tighachiri aha ndị nke pati ha.

Pati ndị ihe ahụ kacha metụta gụnyere PDP, Nigeria Democractic Congress (NDC), African Democratic Congress (ADC) na ndị ọzọ amalitela ịgwa ụlọọrụ Inec na ha ekwetaghị na mwepụ ewepụrụ aha ndị nke ha.

Kedụ ndị aha ha apụtaghị dịka ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ?

Ọkammụta Isa Pantami ji ọkọlọta PDP azọ ọkwa gọvanọ na Gombe steeti bụ otu n'ime ndị aha ha apụtaghị n'akwụkwọ ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ.

Onye ọzọ bụ Oladipupo Adebutu ga-eji ọkọlọtọ pati PDP azọ ọkwa gọvanọ Ogun steeti, mana aha ya apụtaghị n'akwụkwọ ụlọọrụ Inec wepụtara.

Ndị ọzọ ụlọọrụ Inec ewepụtaghị aha ha gụnyere maka ịzọ ọkwa gọvanọ bụ Aminu Gwarzo bụ onye ga-eji ọkọlọtọ pati Nigeria Democractic Congress (NDC), azọ ọkwa gọvanọ na Kano steeti.

Sinatọ Danjuma Tella La'ah ga-eji ọkọlọtọ pati NDC azọ ọkwa gọvanọ na Kaduna steeti bụkwa onye ọzọ aha ya apụtaghị n'akwụkwọ ụlọọrụ Inec wepụtara ga-azọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ.

Ọkammụta Sebastine Hon ga-eji ọkọlọtọ pati Social Democratic Party (SDP) zọọ ọkwa gọvanọ na Benue steeti bụkwa onye ọzọ aha ya apụtaghị n'akwụkwọ Inec wepụtara aha.

Ka ọ dị ugbu a, Adebutu na Pantami na ndị ọzọ aha ha apụtaghị agwala ndị otu ha ka ha dere jụụ n'ihi na pati ha na ụlọọrụ Inec nọ na-akparịtaụka ugbua iji tighachi aha ha n'akwụkwọ.

Kedụ ndị ọzọ ụlọọrụ Inec kọwara ihe mere aha ha apụtaghị?

N'aka nke ọzọ, nchọpụta BBC gosiri na e nwere ndị ọzọ ụlọọrụ Inec etinyeghị aha ha ma kọwaa ihe ha jiri mee ya etu ahụ.

Duwatsu Musa bụ onye ga-eji African Action Congress (ACC) zọọ ọkwa gọvanọ na Kwara steeti bụ onye ụlọọrụ Inec kwuru na ha wepụrụ aha ya n'ihi na o tozughị afọ iri atọ n'ise (35years) bụ afọ iwu obodo Nigeria kwadoro maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ.

Onye ọzọ bụ Aminu Ringim ga-eji ọkọlọtọ pati ADC azọ ọkwa gọvanọ na Jigawa steeti kwuru na ha anabataghi mwepụ ewepụrụ aha Ringim na mmadụ asaa ndị ọzọ ji ọkọlọtọ pati ha na-azọ ọkwa.

Oladipupo Adebutu bụ onye ji ọkọlọtọ pati PDP azọ ọkwa Gọvanọ n'Ogun steeti, ma bụrụkwa onye aha ya apụtaghị n'akwụkwọ ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ.
Nkọwa foto, Oladipupo Adebutu bụ onye ji ọkọlọtọ pati PDP azọ ọkwa Gọvanọ n'Ogun steeti, ma bụrụkwa onye aha ya apụtaghị n'akwụkwọ ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ.

Onye mgbasaozi pati PDP bụ Jugundo Mohammed wepụtara ozi ma kwuo na ha na ụlọọrụ Inec na-akparịtaụka ugbua maka ya bụ ihe.

Otụtụ pati ndị ọzọ ewepụrụ aha ha gwara Inec ka ha werę ọsọ ọsọ tighachi aha ha n'akwukwọ ka udo wee chịa.