Children in the military: America arụọla Nigeria aka dịka mba ebe a na-azụ ụmụaka ịbụ ndịagha

Ụmụaka bụ ndịagha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Gọọmenti mba America ekwuola na Nigeria so na mba ndị nwere ụmụaka e ji alụagha na mbaụwa.

N'ozi ụlọọrụ mba America bụ State Department wepụtara nke a kpọrọ 2026 Trafficking in persons report nke lebara anya n'ọnwa Eprelụ 2025 ruo ọnwa Maachị 2026.

Akwụkwọ gosiri na Nigeria so na mba iri na anọ a na-azụ ụmụaka n'ịbụ ndịagha nakwa.

Nke mere o jiri tinye aha Nigeria n'akwụkwọ ojii ha a kpọrọ 'Child Soldiers Prevention Act, CSPA.

Mba ndị ọzọ nke a metụtara gụnyere Afghanistan, Burma, Central African Republic, DRC, Ethiopia, Iran, Russia, Rwanda, Somalia, South Sudan, Sudan, Venezuela na Yemen.

Ụlọọrụ U.S Department of State kwuru na mmachi a ga-enye Nigeria n'ihi nke a gụnyere inwete ọzụzụ ndịagha, enyemaka ego maka ndịagha, igbochi ndịagha ịga njem imeudo n amba ọzọ, nakwa igbochi iresi ha akụrụngwa ndịagha malite n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ 2026.

Ihe mere aha Nigeria jiri banye n'akwụkwụ a

Foto ndịagha Nigeria nọ n'ụgbọala

Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ndị otu na-eyi ndụ egwu na Nigeria dịka Boko Haram na ISIS-West Africa na-atọrọ ụmụaka, na-azụ ha ịbụ ndịagha na na-etinye ha n'ihu agha site n'ụzọ mmanye n'ike, aghụghọ na nkwanye.

"Ụmụaka ndịagha a nọcha n'afọ iri na abụọ ka a na-eji eme ndị osiite, ịrụ ọrụ n'ụlọ, ịbụ ndị na-agbara ha ama nakwa ọtụtụ ọrụ dị iche iche ka ndị otu a ji ha arụ, tinyere ịbụ ndị ogbunigwe mgbagbu."

Kedụ onye bụ nwatakịrị agha?

Akwụkwọ ahụ ụlọọrụ mba America wepụtara kọwara nwakịrị agha bụ 'child soldier' dịka;

Onye ọbụla nọ n'okpuru afọ 18 na-esonye n'ọgbaghara dịka onye otu ngalaba ọrụ nchekwa nke gọọmenti, ụweojii nakwa nchekwa ndị ọzọ.

Onye ọbụla nọ n'okpuru afọ 18 a manyere n'ike isonye n'ọrụ nchekwa gọọmenti, uweojii nakwa nchekwa ndị ọzọ.

Onye ọbụla nọ n'okpuru afọ 15 ji obi ọcha ya banye n'ọrụ ndịagha gọọmenti, uweojii na ọrụ nchekwa ndị ọzọ.

Onye ọbụla nọ n'okpuru afọ 18 e nyere ọzụzụ maọbụ jiri ya bute ọgbaghara n'ọrụ ndịagha nnupuisi na-abụghị ndịagha gọọmenti.

Ha kwuru na ndị a gụnyere nwatakịrị na-arụ ọrụ enyemaka dịka osiite, ọsa uwe, onye ozi, onye ọrụ ahụike, onye nche maọbụ onye a na-edina.

Nigeria dakwara iwu n'ịtụ mgbere ụmụaka

Akwụkwọ ozi ahụ kwuru Nigeria dakwara iwu maka na ha enweghi ike gbochie ịtụ mgbere mmadụ.

Nke a gụnyere ọdọ ebe a na-akpụ ụmụaka a kpọrọ 'baby factoriesr', ịkwanye ụmụaka ịrụ ọrụ n'ike nakwa iji ụmụaka agba akwụna.

O kwuru na ọtụtụ ọtụtụ ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụaka na-enweghi nne na nna nakwa ebe a na-amụ nwa nakwa ụlọ okpukperechi na-akpachi ụmụnwaanyị, mee ka e dinaa ha n'ike, tụwa ha ime ma mee ka ha mụọ ụmụaka ahụ ka e nwee ike ree ha.