Duane Keffe D Davis: Etu e siri tụọ nwamadị a mkpọrọ afọ 40 maka ogbugbu Tupac Shakur

Ebe foto si, Getty Images
A tụọla onye bụbu onye ndu otu nzuzo na mba America bụ Duane "Keffe D" Davis mkpọrọ afọ 40 maka ogbugbu Tupac Shakur.
Ndị nnochite ọha (jury) mara Davis ikpe n'ebubo egbe gbuo otiegwu ahụ a ma ama na Las Vegas n'abalị asaa nke ọnwa Septemba afọ 1996.
Davis, onye dị afọ 63 kwuru na ọ ga-agbagha mkpebi ahụ
A na-ekwu na ọ bụghị Davis gbara egbe ahụ kpọmkwem mana ọ bụ onyeisi otu gburu ya bụ ọchụ.
O kwetara n'akwụkwọ o dere na ọ bụ ya wetara egbe e ji kpaa arụ ahụ.
Ihe akaebe e nwere megide Davis bụ okwu ọnụ ya bụ ebe o kwuru na ọ nọ n'ime ụgbọala Cadillac dị ọcha oge a gbara egbe ahụ gburu Tupac.
Iji gbalahụ ikpe ya ikpe mpụ, Davis gwara ndị uweojii n'afọ 2008 nke a dịka ha na-enyocha ọnwụ 'Notorious B.I.G' (nke ezi aha ya bụ Christopher Wallace) bụ onye e gburu ka ọ gachara ọnwa ole na ole Shakur nwụrụ.
Davis gara n'ihu kọwaa ihe o mere n'akwụkwọ o dere n'afọ 2019 'Compton Street Legend' bụ nke mere ka ọ malite iwu n'akwụkwọ akụkọ bụ ebe o nwere mkparịtaụka.


























