Akụkọ dị mkpa - Juun 30, 2026
Akụkọ dị mkpa - Juun 30, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- A kpọlatala ụmụafọ Naịjirịa dị narị abụọ na iri isii na itoolu na mkpọlata agba nke atọ gọọmenti Naịjirịa na-akpọlata ụmụafọ ya site na mba Saụt Afrịka.
- Ministrị Naịjirịa na-ahụ maka mmekọ mba ofesi kwuru na ha nabatara ha n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport Legọs oge o ji nkeji iri anọ na asatọ kụọ elekere iri nke ụtụtụ n'ụbọvhị Tuzde abalị iri atọ nke ọnwa Juun 2026.
- Ndị uweojii mba Saụt Afrịka kwụrụ chịm na mpaghara dị iche iche na mba ahụ iji gbochie ọgbaghara obụla dịka a na-egbe ngagharịiwe megide ndị mbịarambịara na-enweghị akwụkwọ ikike na mba ahụ.
- Ngagharịiwe na-abịa dịka otu March and March nakwa pati ActionSA, kwuru na ụbọchị Tuzde 30 Juun bụ ụbọchị ikpeazụ ha nyere ndị mbịarambịara enweghị akwụkwọ ikike ka ha kwara ngwongwo ha pụọ.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






