Onye bụ Geoff Ogunlesi nwafọ Nigeria lụrụ ughegbe oyibo ya bụ Jennifer Meyer nwafọ mba America?

Jennifer Meyer na Geoff Ogunlesi gara emume Gala nke 'Baby2Baby' n'afọ 2023
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Geoff Ogunlesi lụrụ ezigbote ọyị ya nwaanyị kamgbe ọtụtụ afọ bụ Jennifer Meyer n'ụbọchị Satọde n'obodo Hawaii nke mba America.

Geoff bụ nwa nwafọ Nigeria bụ ọkaiwu ma bụrụkwa idejiego aha ya bụ Adebayo Ogunlesi, ọ lụrụ nwafọ mba Amerịka na-arụpụta ihe olu bụ Jennifer Meyer n'ụlọ nkwari Four Seasons Resort Lanai dị na Hawaii.

Tobey Maguire bụbu di Meyer haziri agbamakwụkwọ ahụ dịka ya na Meyer gbachara alụkwaghịm n'ọnwa Sepụtemba.

Ọtụtụ ndị a ma ama na-eme ihe nkiri na Hollywood America dịka Leonardo DiCaprio, Jeff Bezos, Lauren Sanchez Bezos na Courteney Cox so na ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ.

Ogunlesi na Meyer kwupụtara ọmụmụ nwa ha nwoke n'ọnwa Juun afọ a.

Geoff bụ onye hiwere ụlọọrụ Ogunlesi Group, na-ahụ maka ịkpa ndị mmadụ obi aṅụrị n'obodo Los Angeles.

Ọ malitere ụlọọrụ ahụ n'afọ 2022, dịka ọ na-achụ akara aka ya n'iti egwu.

Ụlọọrụ ahụ na-elekọta ndị otiegwu dịka Young Thug, charlieonnafriday, Myles Frost na Alabama Barker.

Geoff si n'ezinaụlọ Ogunlesi a ma ama, nna ya bụ Adebayo Ogunlesi bụ ọkaiwu idejiego nakwa onye ọrụ ụlọakụ na Nigeria. Ndị mmadụ maara ya ọfụma maka ọrụ ya na mbaụwa.

Geoff arụọla ọrụ n'ọtụtụ ụlọọrụ na-etipụta egwu dịka Warner Music Group site na 2013 ruo 2014, tupu o sonye n'ụlọọrụ 300 Entertainment.

O mechara mepee ụlọọrụ nke ya dịka ọtụtụ afọ gachara n'ụlọọrụ ndị ahụ.

Geoff gụrụ akwụkwọ na Hotchkiss School dị n'obodo Connecticut, tupu ọ banye n'ụlọakwụkwọ Amherst College dị na Massachusetts ebe ọ gụchara akwụkwọ ya.

Ọ matara nwunye ya bụ Jennifer Meyer n'afọ 2023.

Meyer kwupụtara maka ọyi ha abụọ na-eme na soshal midia n'afọ 2024.

Onye bụ Adebayo Ogunlesi?

Ogunlesi n'oge emume ụlọọrụ Bloomberg Philanthropies n'afọ 2025 e mere na New York nke mba America.

Bayo Ogunlesi bụ onye ọrụ ụlọakụ si n'Ogun State nke Nigeria. O nwere azụmaahịa akụnaụba ya dị ijeri dọla 106 ($106bn).

Mgbe ọ dị afọ 70, nwamadị a nwee ụlọọrụ Global Infrastructure Partners (GIP) mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya site n'iresi BlackRock ụlọọrụ ya.

Ogunlesi gụrụ akwụkwọ na ngalaba 'Philosophy, Politics na Economics na mahadum Oxford. O mechara gaa na mba America nwete nzere abụọ na Havard.

Ọ bụ onye mbụ na-abụghị nwafọ America rụrụ ọrụ n'ụlọikpe ukwu mba America dịka 'clerk' ma bụrụ ọkaiwu n'ụlọọrụ Cravath, Swaine & Moore dị na New York,

Ogunlesi mechara banye n'ọrụ ụlọakụ n'ụlọọrụ Credit Suisse First Boston n'afọ 1983.

N'afọ 2006, Ogunlesi sonyere mmadụ ise ndị ọzọ n'ịrụkọ ọrụ – Jonathan Bram, Matt Harris, Michael McGhee, Bill Woodburn na Raj Rao.

Ha mechara zụọ ọdọụgbọelu London City n'afọ mbụ ha, mechaa were ọdọụgbọelu Gatwick bụ nke abụọ na mba Briten n'afọ 2009.

Azụmaahịa ahụ ego ya ruru nde paụnds 1.5 ($1.9bn) nke mepere ụzọ nye ha inwete ọtụtụ ụlọọrụ ọzọ dịka ọdọụgbọelu Edinburgh dị na Scotland na ọdọụgbọelu Sydney dị n'Australia.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị