Nigeria na-atụle iwepụta iwu ga-ewepụ ntaramahụhụ maka mmadụ gbara mbọ igbu onwe ya

Ebe foto si, Getty Images/Nigeria Senate/Facebook
Ụlọomeiwu Nigeria amalitela ịtụle akwụkwọ iwu ọhụrụ ga-ewepụ ntaramahụhụ maka mmadụ ịgba mbọ igbu onwe ya.
Atụmatụ iwepụta iwu ọhụrụ a akpalitela arụmụka siri ike n'etiti ndị omeiwu banyere ma mba Nigeria e kwesịrị ịta ndị gbanarịrị mbọ igbu onwe ha ahụhụ maọbụ lekọta ha, ya na ịchọpụta ihe kpatara ụfọdụ ndị Nigeria ji achọ igbu onwe ha.
Iwu ọhụrụ a, nke onye omweiwu bụ Sinetọ Asuquo Ekpenyong nke Cross River steeti kwadoro, pụtara n'ihu ndị omeiwu Sineti Nigeria mgbe a gụpụtachara ya nke ugboro abụọ n'ụbọchị Tuzde13 Ọktoba 2026.
Dịka iwu ọhụrụ a siri kwuo, e nwereike ịta ndị nwara igbu onwe ha ahụhụ site n'ịtụ ha mkpọrọ, maọbụ iji usoro ndị ọzọ lekwasịrị anya n'inyocha, iziga ha ka ha nweta enyemaka ndị ọkachamara, ịgwọ ha, na ilekọta ndị gbanarịrị mbọ igbu onwe ha anya.




























