Gịnị mere Ụka katọlik nke Gboko Diocese ji mechie ụfọdụ ụlọụka, ụlọakwụkwọ na ụlọọgwụ ụka nwe?

Ebe foto si, Gboko Diocese/Facebook
Ihe na-akpọtụ na Benue steeti nakwa na soshal midia bụ na ụka Katọliki na Gboko, Benue steeti emechiela ụfọdụ ụlọụka, ụlọakwụkwọ nakwa ụlọọgwọ ụka ahụ nwere n' obodo Ihugh dị n'Okpuru ọchịchị Vandekiya.
Mana gịnị bụ ihe butere na ụka e ji ịgbasozi ọma banyere mmụta na ahụike ahụ na nke mkpuruobi ga-eji azọpụ ụdị ụkwụ a?
Onyeisi Ụka Katọlik na Dayosis Gboko bụ Most Rev, William Avenya,kwuru na ọ bụ n'ihi oke mwakpo na mmekpahụ.
N'ozi mgbasaozi nke o binyere aka ma depụtara, Avebya kwuru sị, "o teela aka, ihe ụka katọliki nwere na Ihugh na-agabiga nsogbu, nwakpo, mmebiihe na ọtụtụ ajọ ihe ndị ọzọ .
O kwuru na gbajiri ụka ukwu bụ "ọkụ ndị omekome gbara ụlọ akwụkwọ St. Winifred Scondary School".
Ọ tụrụ arịrị ndị omekataraihe daaụjọ awakpoola ụlọakwụkwọ ndị ụka ugborougboro.
"Ha awakpoola ụlọakwụkwọ ahụ ọtụtụ oge na "Oct 28 2025", "May 10th 2026," "May 15th 2026" nakwa "October 11th 2026" nke tinyere ndụ ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi ha na nnukwu nsogbu".
Ebe ndị ọzọ nwakpo ahụ na-eme bụ na, St. Winifred Parish Ihugh, ebe ndị nwakpo ahụ batara bụkọchaa ngwongwo .
Ha ahapụghị St Thomas Hospital Ihugh, ebe ndị ntorobịa mere ngagharị ịwe oge emepere ya june 2024, si na ha achọghị ndị Reverend Sista n'arụ ọrụ na-ya bụ ụlọ ọgwụ.

Ebe foto si, Mathias Mathias/Facebook
"Anyi agbaala mbọ nwee mkparịtaụka n'etiti anyị na ndị obodo ka ha nyere anyị aka kwụsị nwakpo ahụ, mana ihe na-ebe ka na-ebe".
'Anyi gbara mbọ udo'
Ozi Bishọp kwukwara na ha agbaala mbọ udo mana ọ mitaghị mkpụrụ.
" Ụka Katọliki anaghị eji ọsọ ọsọ apụ n'obodo ọbụla, kama anyị na ha akpaala nkata, nwee nzụkọ, rịọ ndị obodo maka udo, mana ihe na-ebe ka na-ebe".
Ọ gara n'ihu kwuo na ụka na-eweta mmepe obodo, ụdọ, ọganihu ebe ọbụla ọ batara, mana ha agaghị agba nkiti ka e gbuo ndị fada, ndị e chiri echichi, ndị nkuzi, ndị dọkinta, ndị ọrụ ahụ ike, ndị na-arịa ahụ, ụmụakwụkwọ na ya bụ nsogbu di n'Ihugh."
Avenya kwuru, "Cheta na akwụkwọ nsọ kwuru na Mathew 10:14 na "ọ bụrụ na ị gaa oziọma kụọ aka n'ụlọ, ma a nabataghị gị, tichaa aja nọ gị n'ụkwụ pụọ na ya bụ ụlọ ma ọ bụ obodo"
Lee ebe ndị omekome wakporo
-St. winifred Secondary School, Ihugh
-St. Thomas Hospital Ihugh, Salus mind care, Hospital Chaplaincy
-St. Winifred Nursery and Primary School, Ihugh.
-St. Winifred Parish, Ihugh.

Ebe foto si, Hyacinth Alia/Facebook
Iji chekwaba ndụ ha, Bishop Avenya ewepụla ụkọchukwu niile n'arụ ọrụ ebe ahụ, ndị niile echiri echichi ma mechie parish, ụlọ ọgwụ na ụlọ akwụkwọ.
O nyere ntuziaka ka ụmụ akwụkwọ gawa ebe ọzọ, ebe ebuuru ndị n'aria ahụ gaa ụlọ ọgwụ ọzọ.
Ọ kpọrọ oku ka ndị dayọsis ahụ banye n'ekpere maka ọnọdụ ọjọọ ahụ, gwakwa parish niile ka ha kaa ụka ụdo, malite ekpere Rosary na ọnwa oktoba niile.
O nyekwara iwu ka onye ọbụla kpee ekpere, buo ọnụ pụrụ iche ụbọchị 23rd oktoba maka udo na mkpezi.
Benue steeti bụ ụkọchukwu ụka katọliki Rev Father Hycinth Alia bụ Gọvanọ ya.
Sent from my iPhone
























