2027 Elections: Ihe ise kwesịrị ime iji kwado onwe gị maka ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọ fọrọ abalị otu narị (100 days) tupu ntuliaka Nigeria akụrụ ọnụ, ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Nigeria bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwụpụtala njikere ụlọọrụ ha dị ịhazi ntuliaka ahụ.
Ị chọrọ isonye ọfụma na ntuliaka ahụ nke ọma tupu oge eruo., lee ụzọ ị ga-esi akwado onwe gị,dịka onye ọkaiwu nakwa onye na-agbachitere ikike mmadụ bụ Sonnie Ekwowusi kọwaa:
1.Gbaa mbọ nata PVC gị

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi Inec bụ Joash Amupitan mara ọkwa na ọnụọgụgụ ndị debanyere aha ha n'akwụkwọ ndenyaha maka atụmvootu eruola nde 103(103million.
Mana nke bụ eziokwu abụghị idebanye aha, kama ọ bụ ị natara akwụkwo gosiri na i mere nke a nke a kpọrọ permanent voters card maọbu PVC n'ịchafụ.
Amupitan kwuru na Inec ga-emepe ohere ndị mmadụ ịnara PVC n'ụlọọrụ okpuru ọchịchị ha malite na Fraide abalị itoolu nke ọnwa oktoba.
2. Kwadebe nri na ihe ndị dị mkpa n'ụlọ

Ebe foto si, Getty Images
Ekwowusi dụrụ ọdụ ka ezinaụlọ ọbụla zụta nri na ihe ndị ọzọ ha ga-achọ tupu oge ntuliaka eruo.
O kwuru na ọ bụrụ na mmadụ na-atụ anya ịnọ n'obodo ya n'oge ntuliaka, ọ ka mma ịkwadebe nri na ihe ndị dị mkpa tupu oge eruo kama ichere ruo mgbe ọnọdụ ga-amalite isi ike.
3. Kwado etu ị ga-esi anọ nso ebe idebanyere aha

Ebe foto si, Gettyy Images
Ekwowusi gwara na BBC Igbo Ọwụwa Anyanwụ na-agakarị obodo ha n'oge Ekeresimesi na Afọ Ọhụrụ, kwesịrị ichebara ntuliaka ahụ echiche mgbe ha na-eme atụmatụ njem ha.
Cheta na Inec tinyere ntuliaka okwa onyeisiala na nke ndị omeiwu etiti maka abalị 16 Jenụwarị 2027(16/1/2027), ebe ntuliaka gọvanọ na nke ndị omeiwu steeti ga-esote na 6 Febụwarị, afọ 2027 ( 6/2/2027.)
Ekwowusi dụrụ ụmụafọ Naịjiria ọdụ ka ha mee atụmatụ maka ịnọ ogologo oge n'oge njem emume ha na-abịa.
Ọ kọwara na ọtụtụ mmadụ nwere ike ịchọ ịnọ n'obodo ha ruo mgbe ha ga-eme ntuli aka ahụ.
Ọ kwụrụ na ọnụnọ a nwere ike ibute mmefu ego njem, mgbanwe na usoro ọrụ, nakwa nsogbu ndị ọzọ.
Mana ọ gbara ndị Nigeria ume ka ha dị njikere ịchụ aja ka ha wee nwee ike iji ikike ha nwere ịtụ vootu mee ihe.
4. Kpachara anya ma nọrọ na nche

Ebe foto si, Sonnie Ekwowusi
Ekwuosi gbakwụnyere na ndị na-atụ vootu kwesịrị ịkpachara anya tupu ntuliaka, oge a na-eme ya nakwa mgbe e mechara ntuliaka.
O kwuru na ndị na-atụ vootu kwesịrị ịma ihe na-eme n'ebe ha na-atụ vootu, ma ghara ikwe ka onye ọbụla manye ha ime ihe megidere iwu.
Ọ dụrụ ọdụ sị, "Ekwela ka egwu maọbụ iyi egwu gbochie ha ịga tụọ vootu."
5. 'Chebe vootu gị'

Ebe foto si, Getty Images
Ekwuosi kwuru sị,"Ọrụ onye na-atụ vootu anaghị akwụsị mgbe o tụchara akwụkwọ vootu ya.
"Ndi na-atụ vootu kwesịrị ileba anya n'ihe na-eme n'ebe ha na-atụ vootu, ma hụ na a gụpụtara vootu ha, dịka iwu si kwuo.
Ọ dụrụ ndị mmadụ ọdụ ka ha jiri ụzọ ziri ezi na udo chebe ikike ha na vootu ha, kama itinye ndụ ha n'ihe egwu maọbụ ịlụ ọgụ.





























