Dangote Refinery IPO: Gịnị mere ụlọọrụ a ji gbatịa ohere ịzụta oke?

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Dịka ụlọọrụ na-esika mmanụ agbịdị bụ 'Dangote Petroleum Refinery and Petrochemicals FZE, (DPRP), mara ọkwa na ha ejirila izuụka abụọ gbatịa ohere ọha mmadụ nwere iji zụta oke na ndị nwe ụlọọrụ ahụ, ajụjụ ụfọdụ kpụ n'ọnụ bụ, kedụ ihe mere ụlọọrụ ahụ ji nwee ụdị mkpebi ahụ ebe e cheburu na ọtụtụ mmadụ zụrụ ya n'ime oge e nyere.
N'ihi mgbatị ahụ, ohere azụmoke IPO ahụ nke malitere n'abalị 14 nke ọnwa Septemba, afo 2026 kwesịrị ịkwụsị n'abalị 13 nke ọnwa Oktoba afo 2026, ga-adịgide ruo abalị 27 nke ọnwa Oktoba ahụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Gịnị mere ha jiri gbatịa ohere azụmoke IPO ahụ?

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ ahụ kwuru na nke a bụ iji nye ohere ka ọha mmadụ n'Africa sonye n'ịzụ oke n'ụlọọrụ ahụ, dịka akwụkwọ ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Sunday Esan binyere aka ma wepụta si kwuo.
Onye nwe ụlọọrụ ahụ bụ Aliko Dangote gwara ndi ntaakụkọ sị: Azụmoke IPO ahu na-aga nke ọma. Anyị na-agbati oge mmechi ya maka na anyị chọrọ ka ụmụ nwoke na nwaanyị n'Africa sonye."
Ọ kọwara na ụlọ mgbere oke nke mba Kenya bụ 'Nairobi Stock Exchange'. na-akpa dịka ha hụtara ya dịka ụzọ ka mma ị hụ na ndị mmadụ sonyere nke ọma.
O kwukwara na ha na ụlọ azụmoke nke mba ndị ọzọ dị n'Africa na-enwekwa mkparịtaụka yiri ya iji hụ na ọtụtụ ndị mba dị iche n'Africa sonyere.
N'uche ụfọdụ, o nwere ike ọ bụrụ na ụlọọrụ ahụ enwetazughị ego ole ha tụrụ anya, Dangote kwuru na ha enwetala karịa mmaji atọ maọbụ anọ nke ego ole ha tụburu anya.
" Ya mere ọ bụghi maka ego ole anyị nwetarala kama ọ bu ka ọtụtụ ndị mmadụ sonye n'ohere a ka anyị mkpa."
Chetat na Dangote Refinery na-ere oke ruru 4,100,000,000 n'ọnụ N525.00 maka otu oke, otu oke nke ụlọọrụ ahụ chọburu iji nweta ego dị otu ijeri dọla na ụma isii($1.6 billion) nke pụtara tarị naira abụọ na ụma iri na ise ( ₦2.15 trillion).




























