NNPC petrol price discount: Ihe di n'ime 'onyinye' mmanụ ụgbọala gọọmenti Nigeria na-enye ụmụafọ ya

Ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company, (NNPC) .
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọọmenti Nigeria ekwuola na ha ga-ebudata ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Nigeria n'ime ụbọchi iri atọ site n'ụlọọrụ ha na-ere mmanụ ụgbọala bụ Nigerian National Petroleum Company (NNPC).

Mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba bụ Taiwo Oyedele kwupụtara nke a n'Abuja n'ụbọchị Tọzde 9 Ọktoba 2026 ma sị na ha anaghị eweghachite ego enyemaka mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'subsidy' bụ nke ha wepụrụ n'afọ 2023.

Kama o kwuru na gọọmenti ga-enye NNPC ohere ka ha ree mmanụ ụgbọala n'ọnụego ha zụtara ya n'ime ụbọchị iri atọ site n'iwepu uru ha na-erite n'ire mmanụ ụgbọala.

Ha kwuru na ndị ga kachasị rite uru n'atụmatụ ahụ bụ ndị ọrụ njem ụgbọala, na nke a bụ mbọ ọhụrụ gọọmenti na-agba iji belata ahụhụ ndị Nigeria na-ata n'ihi oke ọnụahịa mmanụ ụgbọala nakwa ime njem.

'Ibelata ego mmanụ ụgbọala abụghị iweghachite subsidy'

Minista na-ahụ maka akụnaụba na Nigeria bụ Taiwo Ayodele
  • Ministri na-ahụ maka akụnaụba kwuru na kamgbe ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 2026 ka ndị mmadụ malitere izụ mmanụ ụgbọala n'ọnụ ala n'ọdụmmanụ ụlọọrụ NNPC dị iche iche.
  • 'Ibelata ego a bụghị iweghachite 'subsidy' - O kwuru na ha kpebiri ka NNPC wepụ ego n'uru o kwesịrị inwete site n'ire mmanụ ụgbọala ma were ego ahụ nye ndị mmadụ ka ha zụọ mmanụ ụgbọala n'ọnụego dị ala.
  • 'Ọ bụghị ego ọha ka e ji agwụ ụgwọ mbelata ọnụahịa' – Minista kwuru na ego ha ji akwụ ụgwọ mbelata ọnụego mmanụ ụgbọala esighi n'akpa ego gọọmenti. O kwuru na NNPC na-azụta mmanụ n'aka ụlọọrụ Dangote ma belata ego dị n'uru ha kwesịrị inwete site n'ire mmanụ ụgbọala ahụ.
  • O kwuru na NNPC na-arụ ọrụ dịịrị ha nke bụ ime ka mmanụ ụgbọala gazuo ebe niile na Nigeria na-abụghị ilekwasị anya n'inwe nnukwu uru ahịa.
  • Ọ gara n'ihu kwuo na mbelata ego ahụ agaghị emetụta uru NNPC na-enwete site n'ire mmanụ ụgbọala maọbụ ego na-abata n'akpaego gọọmenti.

'Gọọmenti chọrọ iji nwayọọ weghachite subsidy'

Atiku Abubakar ji aha pati ADC azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa

Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ama gọọmentị aka katọrọ mbelata ego ahụ, kọwaa ya dịka ihe na-enweghị isi. Ha kwuru na ọ bụ ụzọ gọọmentị chọrọ iji weghachite subsidy.

Atiku Abubakar ji aha pati African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa onyeisiala, juru gọọmenti ihe ga-eme ma ụbọchị 30 ahụ gachaa.

O kwuru na enyemaka ga-adị naanị ụbọchị 30 agaghị edozi nsogbu oke ọnụahịa ihe ndị mmadụ ji ebi ndụ.

N'otu aka ahụ, otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Nigeria Democratic Congress' (NDC) kọwara ya dịka oge na-ezughị iji dozie nsogbu ndị Nigeria na-agabiga.

NDC dọrọ aka na ntị na atụmatụ ahụ nwere ike ime ka igwe mmadụ wujụọ n'ọdụmmanụ NNPC a ga-ahọpụta.

'Mbudata ọnụego mmanụ ụgbọala a agaghị eru n'ime ime obodo'

Nnaemeka Onyeka Obiaraeri, ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba

Otu onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba bụ Nnaemeka Obiaraeri, kọwara atụmatụ ahụ dịka ihe na-agaghị amịta mkpụrụ n'ịkwalite ọdịmma na azụmaahịa ụmụafọ Nigeria.

O kwuru na NNPC nwere ihe dịka ụlọọrụ mmanụ ụgbọala 300 na Nigeria niile, nke ọtụtụ n'ime ha nọ na mpaghara obodo mepere emepe.

Nke a nwereike ime ka ndị bi n'ime ime obodo ghara irite uru dị n'atụmatụ ahụ.

N'otu aka ahụ, gọọmenti tụrụ arọ na ha chọrọ ka ọnụego a ga na-ere mmanụ ụgbọala bụrụ otu puku naịra na narị atọ na iri ise (₦1,350) kwa lita.

Ha kwuru na nke a bụ iji belata oke mbugharị ọnụahịa mmanụ ụgbọala ma e nwee gbanwe n'ọnụahịa nke mba ụwa.

Arọ a ha tụrụ kwuru na ndị na-esipụta mmanụ ụgbọala nakwa ndị na-ebubata ya ga-akwụ ego mara ya n'elu ma rie uru ya ma ọ bụrụ na ọnụahịa mbaụwa dị mma.