Rochas Okorocha: Ọ bụ eziokwu na ndị uweojii nwụchiri ya?

Aka chịburu Imo state bụ Sịnetọ Rochas Okorocha na ndị nkwado ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja ekwuola na ha nwụchiri aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha n'abalị Mọnde 12 Ọktoba, 2026.

N'ozi ụlọmgbasaozi mpaghara wepụtara, ka ha kwuru na ọnụ na-ekwuru isi ụlọọrụ ndị uweojii Nigeria bụ Aniete Iniedu gwara ha nke a.

Ha kwuru na a nwụchiri Okorocha n'Abuja, mechaa tọhapụ ya na beelụ ka o ruru otu elekere a gbara ya ajụjụ gbasara ebubo ịkpa nkata ọjọọ, iwepụta ozi adịgboroja na ikwu na ya bụ onye ọ na-abụghị.

Ka ọ dị, akụkọ ahụ kwuru na Iniedu sị na a gwara Okorocha ka ọ laghachi n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'ụbọchị Tuzde maka ịga n'ihu na nnyocha a na-eme ya.

Ka ọ dị, aka chịburu Imo State bụ Rochas Okorocha apụtala kwuo na o nweghị oge ọbụla ndị uweojii nwuchiri ya.

Okorocha, onye bụbu sịnetọ na-anọchite anya mpaghara Orlu a maara dịka Imo West kwupụtara nke a n'onyonyoo o mere n'abalị Mọnde 12 Ọktoba 2026.

N'ihe onyonyoo ahụ o wepụtara n'akara Facebook ya, ka Okorocha kwuru na ya ka nọ n'ụlọ ya dị na Maitama Abuja.

O kwuru na ọ bụghị eziokwu na ndị uweojii anwụchiela ya dịka ụfọdụ mmadụ na ụlọmgbasaozi dị iche iche siri kwuo.

N'onyonyoo ahụ, a hụrụ ka Okorocha nọ n'oche n'ime ụlọ ya, ebe ụfọdụ ndị nkwado ya ji ọchị na-akọwa na o nweghị ihe mere Owelle.

Ha sịrị: "Taa bụ ụbọchị Mọnde 12 Ọktoba, ma anyị nọ ugbua na Maitama. O nweghị ihe na-eme, anyị nọ ebe a."

Ihe Rochas Okorocha kwuru

Ndị mgbasaozi Rochas Okorocha ekwusiela ike na ọ bụghị eziokwu na ndị uweojii nwụchiri ya n'ụbọchị Mọnde, dịka ha gbara isi akwara na eziokwu emechaala pụta ihe.

N'ozi o mere ka o ruo BBC aka n'ụbọchị Tuzde 13 Ọktoba 2026, odeakwụkwọ mgbasaozi Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo zaghachiri ozi Kọmịshọna mgbasaozi n'Imo state bụ Declan Emelumba wepụtara nke isiokwu ya bụ "Ikike nnwuchi: Asị Okorocha"

Onwuemeodo kwuru na ụlọikpe nọọrọ n'ụbọchị 14 Septemba, 2026 kagbuo ikike nnwuchi ha nyere n'ụbọchị 9 Septemba 2026, nke mere o jiri jụọ etu ikike nnuchi a kagburu ga-eji bụrụ ihe a ga-eji rụọ ọrụ n'ọnwa Ọktoba.

Ozi ahụ kwukwara na ọ bụ asị na a nwụchiela aka chịburu Imo state, ma kpọghachi oku ka ndị na-ebugharị akụkọ ahụ rịọ ndị Nigeria mgbaghara maka ifesa akụkọ ụgha.

N'ikpeazụ, Onwuemeodo kwuru na dịka ozi gọọmenti Imo state wepụtara siri kwuo, ikike ahụ ụlọikpe nyere n'ụbọchị 9 Septemba enweghị ihe jikọrọ ya na akwụkwọ mkpesa Nnukwu Kọmịshọna Inec n'Imo state bụ Chukwuemeka Ibeziako nyere n'ụbọchị 8 Ọktoba, 2026.

Rochas Okorocha

Ọnọdụ a na-abịa dịka e bugharịrị akụkọ n'ịntaneti, kwuo na ndị uweojii anwụchiela Rochas Okorocha.

Akụkọ ahụ kwuru na ọ bụ n'abalị Mọnde 12 Ọktoba 2026 ka ndị uweojii nwuchiri Sịnetọ Okorocha n'ụlọ oriri REIZ Continental Hotel dị n'Abuja.

Onye enyemaka gọvanọ Imo state n'ihe gbasara mgbasaozi ọgbaraọhụrụ bụ Ambrose Nwaogwugwu bipụtara akụkọ na ndị uweojii nwụchiri Rochas n'akara Facebook ya n'ụbọchị Mọnde n'ihi ebubo ịkpa nkata ọjọọ, iwepụta ozi adịgboroja na ikwu na ya bụ onye ọ na-abụghị.

"A nwụchiri Rochas Okorocha bụbu gọvanọ Imo state dịka ọ jụrụ ịza oku ndị uweojii kpọrọ ya ugboro abụọ, nke metụtara nnyocha a na-eme ya gbasara mpụ, bụ nke mere ndị uweojii jiri nata ikike iji nwụchie ya," ka Ambrose Nwaogwugwu dere n'ozi ahụ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na a kpọburu Okorocha oku n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja n'ụbọchị 2 Septemba 2026, ma mechaa tinyezie ya n'ụbọchị 8 Septemba n'ihi arịrịọ ndị Ọkaiwu ya, mana o mechaghị za oku ahụ.

Rochas Okorocha na ndị nkwado ya

Cheta na akụkọ kwuru na Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja nyere iwu ka a nwụchie aka chịbụrụ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, onye bụbu Sịnetọ mpaghara Okigwe bụ Ifeanyi Araraume na mmadụ anọ ndị ọzọ maka ebubo ịkpa nkata rụọ mpụtara adịgboroja nke ntuliaka imeụlọ otu APC.

Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Nigeria bụ Independent National Electoral Commission (INEC) gwara ndị uweojii na ndị uweojii nzuzo Nigeria bụ Department of State Services (DSS) ka ha nyochaa Okorocha maka ebubo na ọ na-ebugharị asambodo mpụtara ntuliaka imeụlọ adigboroja nke otu APC.

Mana Okorocha gọrọ sị na ụlọikpe enyeghị ụdị ntuziaka ahụ, kama ọ bụ ndị na-agba ya ụkwụ na-ebugharị akụkọ ụgha ahụ.

N'okwu ya site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Sam Onwuemeodo, Okorocha sịrị, "Anyị na-ekwu hoohaa, na o nweghị ụlọikpe, ma Majie, ma Ụlọikpe Ukwu nyere iwu ka a nwụchie Okorocha."

N'ozi Onwuemeodo mere ka o ruo BBC aka n'ụbọchị Sọnde 11 Ọktoba 2026, ọ mara ndị na-ebugharị ozi ahụ aka n'ihu ka ha bipụta iwu ahụ ha sị ụlọikpe nyere, ka ọha ji anya ha hụ n'ime mkpụrụ ụbọchị abụọ.