Ọgbaaghara dapụtara na South Africa mgbe ụmụafọ ha na-achọ ịnapụ ndị mbịarambịa ụlọahịa ha n'ike

Ndị ọrụ South African Police Service (SAPS) na-enyere ndị bi na mpaghara ahụ aka ịchọta ebe nchekwa ma chebe onwe ha pụọ n'ihe ize ndụ.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mkpesa na ngagharịiwe emeela na mpaghara ụfọdụ na South Africa n'ihi mbata na obibi ndị mbịarambịa na-enweghị akwụkwọ ikike nke iwu kwadoro.

A kpọrọ ụgbọala ọkụ na Soweto na Durban, ebe akụkọ kwuru na ndị ngagharịiwe a lekwasịrị anya n'ụlọahịa ndị mbịarambịa nwere. Ọtụtụ mmadụ emerụla ahụ.

Ngagharịiwe nke malitere n'udo na Orlando West dị na Soweto, nke na-akpọ oku ka e mechie obere azụmahịa ndị mbịarambịa nwee, ghọrọ ihe ike mgbe e kwuru na ndị ngagharịiwe ahụ nwetara mgbọ sitere n'aka ụfọdụ mmadụ, dịka ndị bi ebe ahụ siri kwuo. A kpọrọ ụgbọala iri ọkụ.

Na Durban, ọnọdụ ọgbaaghara juru ebe niile ka a na-akpọ ụgbọala ọkụ ma na-ịnapụ ụlọahịa ihe. Ndị uweojii kwuru na ejidela ndị mbịarambịa ọzọ mmadụ atọ maka ebubo na ha wakporo otu onye na-eme ngagharịiwe.

A kọkwara na ngagharịiwe yiri nke a mere na Cape Town nakwa mpaghara Eastern Cape.

Ndị uweojii chụsasịrị igwe mmadụ ndị wakporo otu ebe a na-anabata ndị gbara ọsọ ndụ, ebe ndị ọrụ gọọmenti na-ahazi arịrịọ ọhụrụ maka ịgba ọsọ ize ndụ nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ 'asylum', mgbe mkpebi iwu nke ụlọikpe ukwu nyere n'oge na-adịbeghị anya.