Ndị uweojii enyela iwu ka e mee ezigbo nnyocha banyere ogbugbu 'Don Cross' na Delta state

Kọmịshọna ndị uweojii na Delta state bụ Samuel Erale yi uwe na-acha anụnụ anụnụ ebe ndị nchekwa na ndị obodo kwụ n'ihu ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kọmịshọna ndị uweojii na Delta state bụ Samuel Erale agaruola n'obodo Okpara Inland Community dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ethiope East.

Erale gara njem ahụ dịka a nụchara akụkọ na e gburu otu nwaokoroọbịa a maara nke ọma dịka Don Cross, tinyekwara mwakpo a na-eme ndị ndu obodo nakwa mbibi ngwongwo na akụnaụba ndị mmadụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta state bụ Bright Edafe wepụtara ozi n'ụbọchị Wenezde 14 Ọktoba 2026, kọwaa na njem ahụ Erale gara bụ iji were anya ya tụlee ka ọnọdụ dị n'ebe ahụ ihe ọjọọ ahụ mere.

Edafe kwuru na kọmịshọna ndị uweojii jikwa ohere ahụ nwee mkparịtaụka n'etiti ndị ndu obodo iji weghachi udo ma gbochie ọgbaaghara ịga n'ihu.

Ozi ahụ Edafe wepụtara kwuru na nnyocha ha mere kpughere na ụfọdụ mmadụ a ka na-achọ ịmata ụlọọrụ nchekwa ha si, wakporo ndị na-ere ọgwụike n'obodo ahụ n'ụbọchị 12 Ọktoba 2026, gbaa onye ahụ a na-ekwu okwu ya egbe, dịka o mechara nwụọ oge ọ na-anara ọgwụgwọ.

Ọ sịrị na ụfọdụ ndị ekperima jiri ohere ahụ busoo ndị ndu obodo agha, dịka ha wakporo ụlọ Onyeisi Obodo, mụnye ụgbọala ya abụọ ọkụ ma bibie ụlọ ya.

Ha sị na ndị omekome ahụ wakpokwara ụlọ osote Onyeisi Obodo, ụlọezumezu obodo ma mụnye ụgbọala abụọ na otu ọgbaatumtum ndị nche ọkụ.

Iji zaghachi nke a, e zipụrụ ndị uweojii si n'ụlọọrụ Ughelli Area Command, Isiokolo Division nakwa ndịagha iji weghachi udo na ime ihe n'usoro.

Edafe kwuru na kọmịshọna ndị uweojii jikwa ohere ahụ nwee mkparịtaụka n'etiti ndị ndu obodo iji weghachi udo ma gbochie ọgbaaghara ịga n'ihu.

Edafe mere ka anyị mata na kọmịshọna ndị uweojii kasiri ezinaụlọ e gburu onye nke ha obi ma katọọ ọgbaaghara ahụ.

O nyekwara iwu ka e mee nnyocha miri emi gbasara onye ahụ a gbagburu nakwa ngwonwgo ndị a lara n'iyi, ma nye ntuziaka ka a chọpụta ndị aka ha dị na ya.

Kọmịshọna ndị uweojii ahụ kpọkuru ndị niile aka ha dị na mwakpo ahụ ka ha wepụta onwe ha maka ime nnyocha, ma dọọ aka na ntị na ha ga-eji ike chụsoo onye ọbụla jụrụ irube isi na ntụziaka a, nwụchie ya ma kpee ya ikpe dịka ọ dị n'iwu.