Gịnị butere tigbuo zọgbuo na-adakwasakarị pati NDC n'Enugu state?

Foto na-egosi Chinyeaka Ohaa, yi uwe ọcha, bụ onye ji ọkọlọtọ pati NDC azọ ọkwa Gọvanọ n'Enugu state na aka na-achị steeti ahụ bụ Peter Mbah, yi uwe na-acha anụnụ anụnụ.
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

I ji egbe chụsaa ọgbakọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua n'Enugu state ugbua.

Nke a pụtara ihe n'ụbọchị Satọde abalị iri nke ọnwa Oktoba 2026, ka akụkọ kwuru na ndị uweojii nke steeti ahụ wakporo ndị pati Nigeria Democratic Congress (NDC).

Dịka akụkọ siri okwu, ndị pati ahụ gara n'igwe n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu ịga zute onye ji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa Gọvanọ na steeti bụ Chinyeaka Ohaa, dịka ọ malitere achụmntavootu ya.

Ndị hụrụ ihe mere kọwara na igwe mmadụ ahụ nọ na-agba egwu ma na-eche ka nwamaadi ahụ si n'ụgbọelu pụta, oge ha hụrụ ndị uweojii bịara were egbe na anwụrụ ose (tear gas) chụsasịwa ha.

Ha mechara soro n'igwe gaa n'ụlọọrụ pati nke Ohaa nke dị na mpaghara GRA n'Enugu, ebe ọgbaghara ọzọ dapụtara n'etiti ndị nche nke gọọmentị Enugu steeti na ndị nkwado pati NDC bụ nke akụkọ kwuru na ọgbaaghara ahụ tara isi otu nwoke bụ ọkwọụgbọala aha ya bụ Ifeanyi Christopher Nworie, gbara afọ 43.

Gịnị ka iwu Nigeria na pati NDC kwuru?

Chinyeaka Ohaa bụ onye ji ọkọlọtọ pati NDC azọ ọkwa Gọvanọ Enugu state na Ntuliaka 2027

Na Nigeria, iwu kwadoro pati dị iche iche ime ọgbakọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ otu n'ime ụzọ ndị ha si achụ nta vootu n'oge ntuliaka.

Mana oge ụfọdụ, akụkọ ọjọọ na-apụtakarị na ya bụ ọgbakọ dịka ndị ọrụ nchekwa na-eji anwụrụ ose maọbụ egbe chụsaa ndị gbakọrọ, ebe ndị akpụobi iji egbe na mma chụsaa ma meruo ndị mmadụ ahụ.

Ọzọkwa bụ na ndị ndọrọ ndọrọ ọzọ na-abịa megide ndị nke na-enwe nzụkọ bụ ihe na-akpalite ọgbaaghara.

Akụkọ kwuru na ụdị ọgụ a ataala isi ọtụtụ mmadụ, ma mebie ọtụtụ ihe n'ebe dị iche iche na Nigeria. Ugbua, Nigeria na-akwado ntuliaka n'afọ 2027, akụkọ ndị a amalitekwala ịpụtawa ihe ọzọ.

Banyere nke e kwuru mere n'Enugu state, ndị pati ekwupụtala na ọ bụ ndị uweoji gbara igwe mmadụ bụ ndị nkwado ha egbe n'ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị ha nwere.

Chinyeaka Ohaa gwara ndi ntaakụkọ sị, "Ọ bụ na GRA ka ndị uweojii nọrọ gbawa anyị egbe."

Ohaa gara n'ihu boo ebubo na ọ bụ aka ọrụ ndị isi nche gọvanọ nọ n'ọchịchị ugbua dịka ha nyere ndị uweojii iwu ka ha gbaa ndị nkwado pati ahụ anwụrụ ose nakawa egbe nke gburu otu nwoke.

Kedụ ihe ndị uweojii kwuru maka ebubo a?

Foto na-egosi Komishọna ndị Uweojii n'Enugu steeti ebe o yi uwe ndị uweojii na enyo anya na-eji oji ya na okpo na-eji oji n'isi.

Na nzaghachi ndị uweojii gọrọ na ebubo ahụ abụghị eziokwu.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru n'ozi o wepụtara na pati NDC "na-akpa aghara" ma na-alụ ọgụ n'ọdọụgbọelu nke mere ndị uweojii jiri bịa gboo ọgụ.

O kwuru na "Ndị uweojii na ndịagha jịkorọ aka chụsaa ndị otu NDC na-akpa aghara n'ebe e si abata ọdọụgbọelu 'Akanu Ibiam International Airport, Enugu".

"Nnyocha gosiri na ndị ọrụ ọdọụgbọelu gbochiri ndị pati ahụ ịbata n'igwe, eseomokwu dapụtara n'etiti ndị pati ha ha jiri lụwa ọgụ bụ nke mere ka ndị ọrụ nchekwa jikọọ ọnụ bịa gboo ọgụ," ka ọ gbakwunyere.

Gịnị ka gọọmentị Enugu state kwuru maka ebubo ahụ?

Aka na-achị Enugu state bụ Peter Mbah oge o ji igwe eji ekwu okwu agwa ndị mmadụ okwu

Gọvanọ Peter Mbah wepụtara ihe onyonyo ebe ọ nọrọ gwa ndị Enugu na onye ọbụla nwere ikike ime ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị na-atụghị egwu ọbụla.

Mbah gọrọ aka na ụkwụ ya na ọ bụghị gọọmenti ya kpatara ọgbaaghara ahụ wee kwuo na ndị uweojii na-eme nnyocha ịchọpọta ndị niile soro kpata nsogbu ahụ ma taa ha ahụhụ ka iwu siri kwuo.

Gbanyere ọnwụ otu nwoke nke a kpọrọ aha dịka Nworie bụ onye akụkọ kwuru na a gbagburu, odeakwụkwọ nke gọọmentị Enugu steeti bụ Ọkammụta Chidiebere Onyia, gọrọ sị na ọ bụ mgbọ tụrụ nwoke ahụ e were buga ya n'ụlọọgwụ.

Kedụ ugboro ole a wakporo ndị pati NDC n'Enugu state

Nke a abụghị mbụ a na-awakpo ndị pati NDC n'Enugu steeti.

  • N'abalị ise nke ọnwa Septemba, a wakporo ndị otu NDC n' Obuofia (Ndiuno-Obuoffia Awkunanaw nke dị n'okpuruọchịchị Nkanu-West, gbaa ọtụtụ ndị mmadụ egbe, ebe a tụnyere onye setara onyonyo ihe mere n'ụlọmkpọrọ dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo 'ịda iwu ịntanetị'.
  • Ọzọ, a wakpokwara ndị pati ahụ na St Joseph Primary School Agbani bụ ebe a gbara mmadụ abuọ egbe mana ha ji ndụ ha pụta.
  • Ọzọkwa bụ oge ndị bu egbe wakporo ọgbakọ pati NDC n'ụlọakwụkwọ 'St Joseph School Agbani, mebie ochendo na oche ha ji eme nzuko ma chụsasịa ndị gbakọrọ.

Ihe pati ndị anọghị n'ọchịchị na-ekwu

Dịka gọọmenti Enugu steeti nọ na-agọ na ọ bụghị ha ji egbe chụsaa ndị mmadụ n'ọgbakọ pati NDC na steeti ahụ, ndị otu pati ndị anọghị n'ọchịchị nọrọ na nzụkọ ha nwere na nsonso a na-ebo ebubo na ọ bụ gọọmenti Enugu nyụrụ ihe na-esi.

Ndị ọzọ bịara ya bụ nzụkọ gụnyere onye ji aha Peoples Democratic Party (PDP) azọ ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ bụ Uche Nnaji, onye ji pati African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa Gọvanọ bụ Ozo Obodoeze Ocho na ndị niile na-azọ sineti na ụlọnnọchiteanya na steeti.

Ha jikọrọ aka ọnụ katọọ ọgbaaghara ahụ.