Anyị akwụsịtụla ụfọdụ ndị uweojii ọrụ maka Abuloma Police Division a sị ndị otu nzuzo rụzigharịrị - Ndịisi uweojii Rivers state

Otu nwoke kwụ n'ihu ogige ndị uweojii
Nkọwa foto, Anyị akwụsịtụla ụfọdụ ndị uweojii ọrụ maka ụlọọrụ ndị uweojii a sị na ndị otu nzuzo rụzigharịrị - Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivers state
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ ndị uweojii nke Rivers state akwụsịla onyeisi uweojii (DPO) nke Abuloma Police Outpost dị na River state na ụfọdụ ndị uweojii na-arụ n'ogige ndị uweojii ahụ dịka ha gbarụrụ ihu maka ebubo na ha nyere ohere ka ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu nzuzo rụgharị ogige uweojii ahụ.

N'ozi o wepụtara, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivers state bụ Agabe Blessing Kaborlo kwuru na ha anụla gbasara ozi a na-ebugharị n'ogbe nzirịtaozi social media nakwa onyonyoo na-efesa ebe niile maka ụlọọrụ ndị uweojii Abuloma Police Outpost a sị ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo rụzigharịrị.

E kwukwara na ndị ahụ a sị bụ ndị otu nzuzo gara n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ n'ụbọchị Tọzde 15 Ọktoba 2026 iji ṅụrịa ọnụ maka ịrụcha ya.

Agabe Blessing kwuru na ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ ejirila olu ike katọọ omume maọbụ otu ọbụla nwere ike imechu ha ihu.

"Ụlọọrụ anyị ji olu ike na-akatọ omume maọbụ akparamaagwa ọbụla nke nwereike ịkụsasị nsọpụrụ, ezi agwa na ezi usoro ndị uweojii Nigeria ji arụ ọrụ maọbụ nke na-anabata otu nzuzo maọbụ otu ndị ọzọ iwu megidere," ka ozi ahụ kwuru.

Agabe gara n'ihu kwuo na ụlọorụ ndị uweojii niile bụ nke ọhanaeze, bụ ndị e hiwere maka ichekwa ụmụ mmadụ na imejupụta ihe iwu kwuru.

Ọ dọrọ aka na ntị na ụlọorụ ndị uweojii ekwesịghị ịbụ ogige ndị otu nzuzo na ndị ekperima ga-eji chọọ nnabata ọhanaeze nakwa mmetụta.

N'ihi nke a, agbaala onye ji ọkwa Divisional Police Officer na mpaghara Abuloma ajụjụ ma napụ ya ọrụ, tinyekwara onye uweojii na-elekọta ụlọorụ ndị uweojii ahụ a na-ekwu okwu ya.

Agabe kọwara na kọmịshọna ndị uweojii na Rivers state enyela iwu ka e mee nnyocha miri emi iji chọpụta ihe ndị kpatara ọnọdụ ahụ.

O nyekwara iwu ka a chọpụta ihe niile gbasara ndị a na-ebo ebubo ahụ, nakwa otu ndị nyere aka rụzigharịa ụlọọrụ ndị uweojii ahụ.

Ihe ọzọ bụkwa ịchọpụta ndị uweojii nyere iwu ma kwado ọrụ ahụ, ịchọpụta ma ha gbasaro ezi usoro, ịchọpụta ma o nwere onye uweojii na-agbasoghị usoro kwesịrị ekwesị e si eme ihe maọbụ kụsasịa ugwu na nsọpụrụ ụlọọrụ ndị uweojii, tinyekwara ogogo onye uweojii ọbụla jiri tinye aka n'ọrụ ahụ.