Anyị kwenyere na ụlọikpe ga-anabata David Mark dịka Onyeisioche pati ADC - Atiku Abubakar
Oge na-adịbeghị anya, INEC sị na ha agaghị anabatakwa David Mark dịka Onyeisioche pati ADC, kedụ etu i si nabata okwu ahụ?
Anyị enweghị nsogbu maka ikpe ụlọikpe nyere.
Anyị alaghachila Ụlọikpe Mkpegharị. Anyị nwere ntụkwasịobi na ụlọikpe ahụ ga-achabi ikpe oge na-adịghị anya tupu pati anyị emee nnukwu mgbakọ.
Anyị nwere ntụkwasịobi na ụlọikpe ga-anabata David Mark dịka Onyeisioche pati anyị.
Ndị na-ekiri ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na ụnụ enweghị oge.
Ndị na-ekiri ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị abụghị ndị Ọkaiwu.
I chere na ụnụ ga-emechanwu tupu oge ọgbakọ unu eruo?
Anyị ga-emechanwu tupu o ruo.
Ụfọdụ pati ndị ọzọ na-enye gị ohere isonye ha maka nsogbu ndị ụnụ na-enwe na pati gị, i nwereike isonye pati ndị ahụ?
Ụfọdụ pati ndị ahụ enweghị ngalaba.
ADC bụ pati anyị bidoro ịhazi kemgbe otu afọ na ọkara gara aga.
Anyị etinyela ọtụtụ nkwado na nhazi n'ime ya. Ihe anyị na-ele anya ugbua bụ ịhụ na ihe niile gbasara usoro ikpe bịara na njedebe ngwangwa ka anyị nwee ike gaa n'ihu n'ihe omume ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ndị dịka Peter Obi na Kwankwaso nọ na pati ADC, o nwere ndị na-ekwu na ohere gị inweta ọkọlọtọ pati gị ịzọ ọkwa onyeisiala nke afọ 2027 na-agbatu.
ADC bu mbịakọta ọtụtụ mmadụ. Anyị ekwekọrịtala dịka ndị ndu na ohere dịịrị onye ọbụla. Ọ ga-aba onye ọbụla. Onye ga-eji ọkọlọtọ pati azọ ọkwa abụghị ihe esemokwu.
E gbuola ọtụtụ ndị mmadụ na Plateau steeti n'oge na-adịbeghi anya.
Boko Haram emela ọtụtụ mwakpo na Borno steeti, kedụ ebe anyị na-ada mba dịka gọọmenti?
Gọọmenti Etiti etinyebeghị ahụ igosi na ha chọrọ ka e nwee iwu na usoro iji chekwaa ndụ nakwa ihe onwunwe ndị Naịjirịa etu ọ kwesịrị maka ya bụrụ na anyị lụrụ agha obodo 'civil war' n'ime ọhịa ma lụọ ya ọfụma, gịnị bụkwa nụ ime ọhịa ndị nọ na mpaghara ugwu. Enweghị ọhịa dị na mpaghara ugwu Naịjiria.
Ka o si dị ugbua, anyị enweghị ndị ọrụ nchekwa zuru oke. Ha enweghị ngwa agha ọfụma.
Ihe na-eme bụ ịda mba ndị ndu ndọrọndọrọ ọchịchị. Ndị ndu ndọrọndọrọ ọchịchị adaala kụọ afọ n'ala.



