Ọ dị mkpa ka a kwụsị ohi a na-ezu na gọọmentị - Peter Obi
Peter Obi bụ onye ji ọkọlọtọ pati Nigeria Democratic Congress (NDC) azọ ọkwa onyeisiala Nigeria n’afọ 2027 ekwuola mkpa ọ dị ka ndị ọrụ gọọmenti kwụsị ohi ha na-ezu akụnaụba ọha nwee.
Obi kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC nwere ebe ọ nọ kọwaa ụfọdụ ihe ndị ọ ga-eme ma ọ bụrụ na o merie na ntuliaka ahụ.
O kwuru na ọ ga-akpọkọta ụmụafọ Nigeria niile ọnụ na-agbanyeghi n'agbụrụ ha ma mee ka ha bụrụ otu maka ọ dị mma obodo.
O kwukwara na ọ ga-agba mbọ ịhụ na enweghi nchekwa kwụsịrị na Nigeria, nke ga-abụ na ndị na-akọ ugbo na mpaghara ugwu nakwa ebe ndị ọzọ ga-aga n'ugbo na-enweghi nsogbu ọbụla.
Obi gara n'ihu kwuo na ọchịchị ya ga-agba mbọ kewapụta ọrụ nye ndị mmadụ ka ha na-ahụ ihe a ga-eri ma kwụsị ụfọdụ ohi ndị a na-ezu na gọọmenti.
Kirie ihe ndị o kwuru n'uju;



