Ihe mere Rochas Okorocha ji kpụpụ Gọvanọ Hope Uzodimma n’ụlọikpe
Rochas Okorocha bụbu Gọvanọ Imo steeti akpụpụla ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec), pati All Progeressive Congress (APC) na Gọvanọ Hope Uzodimma na-achị Imo steeti n'ụlọikpe.
Mana ọ bụ gịnị mere?
Rochas Okorocha na-ebo ebubo na ọ bụ ya meriri ntuliaka imeụlọ APC mere maka ọkwa Sinetọ ga-anọchiteanya Imo West n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa ma gwa ụlọikpe ka ha nye ụlọọrụ Inec iwu ka ha kachapụ aha Hope Uzodimma n'akwụkwọ ha.
Okorocha chịrị Imo steeti dịka gọvanọ ugboro abụọ, mere ka o doo anya na ọ bụ aha ya kwesịrị ịdị n'akwụkwọ Inec dịka onye meriri ntuliaka imeụlọ ahụ.
Ọ gara n'ihu kọwaa na akwụwkọ ndekọ ndị ọrụ Inec haziri ntuliaka ahụ e mere na 18 Mee, 2026, gosiri na ọ bụ ya meriri ntuliaka ahụ ma kwuo na Inec kwesịrị irube isi nye ndekọ ahụ.
Akwụkwọ mkpesa Rochas Okorocha degaara ụlọikpe, o kwuru na ya ji vootu dị 150,780 merie Hope Uzodimma onye nwetara naanị vootu 102,158.
Okorocha gara n'ihu kwuo na ọchịchị Gọvanọ Uzodimma ga-abịa na njedebe na Jenụwarị 2028 ma kọwa na nke a pụtara na Gọvanọ Uzodimma ka ga-anọ n'ọkwa dịka gọvanọ Imo steeti oge a ga-edu ndị omeiwu sineti n'iyi ọrụ n'afọ 2027.
Rochas Okorocha gwara ụlọikpe ka ha tulee ka iwu akwadoro Inec ikwu na ọ bụ Gọvanọ Uzodimma meriri ntuliaka ahụ ma gwa Gọvanọ Uzodimma ka ọ hapụ ị na-ekwu na ọ bụ ya meriri ntuliaka ahụ.
Ọtụtụ mmadụ kwuru na ha hụtara ya dịka ihe ịtụnanya oge Gọvanọ Hope Uzodimma zọrọ ntuliaka imeụlọ APC ahụ n'agbanyeghị na ọchịchị ya dịka Gọvanọ bụ n'afọ 2028 ka ọ ga-agwụ.
Nke bụ eziokwu bụ na Gọvanọ Hope Uzodimma ekwubeghị etu ọ ga-esi mee ya maka na iwu Naịjirịa anabataghị otu onye iji ọkwa abụọ otu oge.
Cheta na oge Rochas Okorocha rituru n'ọkwa dịka Gọvanọ n'afọ 2019, o nwetara mmeri na ntuliaka afọ ahụ dịka Sinetọ na-anọchiteanya Imo West n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa.
Mana Osita Izunaso meriri ya Okorocha na ntuliaka 2023 dịka Sinetọ na-anọchiteanya Imo West n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa.



