Ndị 'corper' 20 a tọọrọ n'Imo State enwerela onwe ha - Olubadan

Olubadan nke Ibadan bụ Oba Rashidi Ladoja na ụfọdụ ndị corper
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

A tọhapụla ndị ntoroọbịa iri abụọ ji otu afọ na-efe ala nna ha Bekee kpọrọ, 'National Youth Service Corps' (NYSC) nakwa otu onye ọzọ a tọọrọ n'okporoụzọ si Owerri gawa Onitsha n'Imo Steeti.

Mmadụ ndị ahụ a tọhapụrụ na-anara ọgwụgwọ ugbua n'ụlọọgwụ ngalaba nchekwa DSS dị n'Owerri.

Ka ọ dị ugbua, Onyeisi na-elekọta NYSC bụ Brigadier General Olakunle Oluseye Nafiu agaala n'ụlọọgwụ DSS dị n'Owerri ileta ndị ahụ a tọọro.

Ọ bụ ya na kọmịshọna ndị uweojii n'Imo State, Onyeisi ụlọọrụ DSS nakwa Ọchịagha ndịagha 34 artillery brigade dị n'Obinze soro gaa njem ahụ.

Ka o sinadị, Olubadan nke Ibadan bụ Oba Rashidi Ladoja ejirila ọnụ ya kwupụta na a tọhapụla ndị ntoroọbịa iri abụọ ji otu afọ efe ala nna ha a tọọrọ n'Imo state.

Olubadan mere ka anyị mata nke a n'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Adeola Oloko tinyere aka na ya, nke isiokwu ya bụ "a tọhapụla ndị ntoroọbịa ji otu afọ efe ala nna ha a tọọrọ n'Imo state."

N'ozi ahụ, Olubadan mere ka anyị mata na ọ bụ gọvanọ Imo Steeti tụpenyere ya azụ gbasara nke ahụ oge ha nwere mkparịtaụka n'ekwentị.

"Gọvanọ Imo State bụ Hope Uzodimma mere ka anyị mata nke a site na mkparịtaụka ya na Olubadan nke Ibadan bụ Oba Rashidi Ladoja nwere n'ekwentị mgbe ọ kụrụ elekere ise nke mgbede taa bụ Wenezde 7 Ọktoba 2026," ka Adeola Oloko kwuru.

A tọọrọ ha n'Ọgbakụ dị n'Imo steeti dịka Nigeria na-emerube emume ncheta afọ 66 ha nwetara nnwereonwe n'aka mba Briten.