Harrison Anazodo: Ndị ụka kụrụ ndị ntaakụkọ ihe n'ikpe ụkọchukwu a sị napụrụ ndị mmadụ nwunye ha

Ebe foto si, BBC/screengrab
Ndị ụka ụkọchukwu a na-ekpe ikpe n'Ụlọikpe Ukwu nke steeti Anambra maka ebubo ịnapụ ọtụtụ ndị mmadụ nwunye ha akụọla ndị ntaakụkọ ihe n'ụlọikpe ụbọchị Tuzde dịka ha gbalịrị igbochi ha ise onye ndu ka foto .
Nke a na-eme dịka e butere Ụkọchukwu ụka 'Dayspring Assembly' dị n'Awada n' Obosi, Anambra steeti bụ Harrison Anazodo ụlọikpe maka ikpe iji nweta ohere isi n'ụlọ abịa ịzara ọnụ ya n'ebubo metụtara ikposa ezinaụlọ nakwa ịgbasa ozi na-akwalite ego mbute.
Ndí ụka ya jicha ncheanwụ bata n'ogige ụlọikpe iji kpuchie Ụkọchukwu ahụ dịka e bu ya si n'ụgbọala baa ụlọikpe ka ndị ntaakụkọ ghara iseta ya foto maọbụ ihe onyonyo.
Onye ntaakụkọ anyị nọ n'ụlọikpe oge o mere gwuru sị, "E butere ụkọchukwu Ọnitsha n'ụlọikpe, ndị ụka ya wakporo ndị ntaakụkọ gbalịa igbochi anyị ise ya eserese. Ha mebiri ụfọdụ ngwa ọrụ anyị ji arụ ọrụ dịka ha na-eme nke a."

Ebe foto si, Dayspring Assembly/Facebook
N'ikpe e kpere ya n'ụbọchị Tuzde, ụlọikpe jụrụ inye ya ohere isi ụlọ abịa ikpe(bail) kama ọkaikpe nyere iwu ka a tụnye ya na mkpọrọ dị n'Awka ganye abali 16 nke ọnwa Oktoba, afọ 2026.
Anazodo, onye e ji anyịnya igwe bubata n'ụlọikpe tinyeburu akwụkwọ ịrịọ ụlọikpe ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe ya n'ihi ọnọdụ ahụike ya.

Mana dịka ụlọikpe si kwuo, akwụkwọ ụlọọgwụ nke Anazodo wetara n'ụlọikpe bụ nke a kpara aka.
Ụloikpe kwukwara na ihe ọzọ a gaghị e ji nye ya ohere isi n'ụlọ abịa ikpe bụ n'ihi nchekwa ndị akaebe bụ ndị e kwuru na Anazodo majara, ma sị na a hapụ ya na o nwere ike ibute nsogbu n'ogbe ya.
Ụlọikpe gara n'ihu kwuo na nwoke ahụ enweghị ihe ọ na-arụ doro anya , nke o ji abụ onye nwere aha n'ogbe ya, nke pụtara na o nwere ike ịgba ọsọ ma a hapụ ya ka o si n'ụlọ abịa ikpe.
Cheta na gọọmentị Anambara steeti nwuchiri Anazodo ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo ịgbasa ozi na-akwado ego mbute nakwa ịnapụ ụfọdụ ndị ụka ya nwunye ha nye onye ọzọ maọbụ lụwa ha.





























