Lagos, Kano na steeti ndị ọzọ kachasị debanye aha maka atụmvootu na ihe ise gbara ọkpụrụ Inec kwuru maka 2027

Ọkammuta Joash Amupitan
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka a na-akwado maka ntuliaka afọ 2027, ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ 'Independent National Electoral Commission (INEC)' ekwuola na ọ bụ Lagos steeti kachasị n'ọnụọgụgụ ndi debanyere aha maka ịtụ vootu .

Onyeisioche Inec bụ Joash Amupitan, ọnye gbara ama a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Tuzde kwuru na ọnụọgụgụ ndị debanyere aha na Naijiria gbaa gburugburu ugbua bụ nde otu narị na iri ( 110 million.).

N'ọgbakọ ahụ nke ọtụtụ ndị ntaakụkọ, ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye nakwa ndị nnọchiteanya otu mbaụwa dị iche iche gara, Amupitan kwupụtara njikere ụlọọrụ ya dị ịhazi ntuliaka 2027 ka ọ gaa nke ọma.

Lee ihe ise gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:

1. Steeti iri kachasị debanye aha

Lee ngụkọ steeti iri kachasị debanye aha dịka Amupitan si gbaa ama:

1. Lagos - 7,488,633

2. Kano - 6,000,570.

3. Kaduna - 4,000,640

4. Katsina - 3,876,051.

5. Oyo - 3,588,111

6. Delta- 3,525,988

7. Rivers - 3,000,734

8. Benue - 3,057,225

9. Ogun - 3,037,981

10. Bauchi - 3,000,047.

2. Iwere PVC ga-amalite

Amupitan kwuru na ikesa akwụkwọ ikike ịtụ voote nke a kpọrọ 'Permanent Voters' Card (PVC) ga-amalite n'abalị itoolu nke ọnwa Oktoba afọ 2026 ma gwa ụmụ amaala ka ha gaa were nke ha.

3. Ịgbasa mpụtara ntuliaka

Amụpịtan kwuru na ịgbasa mpụtara ntuliaka agaghị abụ naanị n'ikuku n'ihi nsogbu ikuku nzirịtaozi n'ime ime obodo ma kwuo na ọ ga-abụ ma n'ikuku ma n'aka.

4. Ọ dọrọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka na ntị

Onyeisioche Inec kwuru na Inec ga-abịagide onye ọbụla tinyere aka na tigbuo-zọgbuo maọbụ ịzụ vootu site na nkwado ụlọọrụ EFCC.

N'okwu ya, o nweghị onye dị mma ka a nwụọrọ ya n'ihi okwu ndọrọndọọ ọchịchị.

5. 'Ndị ọrụ Inec bụ ndị ego ụgwọọnwa kachasị pee mpe'

Ọkammụta Amupitan kwara arịrị na ndị ọrụ Inec bụ ndị kachasị anata obere ego dịka ụgwọọnwa ha na Naijiria.

Ọ sịrị, "Ndị ọrụ Inec bụ ndị a na-akwụ ụgwọọnwa pekasịrị mpe na Nigeria. Anyị chere na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ha rụọ ọrụ n'ụzọ ziri ezi, anyị kwesịrị ịkwụ ha ụgwọọnwa tozuru ibi ndụ."