Ihe Seyi Makinde na Hope Uzodimma na-akpa maka ndị NYSC a tọọrọ

Ebe foto si, Hope Uzodimma /Seyi Makinde
Gọvanọ Oyo Steeti bụ Seyi Makinde ekwuola na gọmentị ya na nke ogbo ya nke Imo steeti bụ Hope Uzodimma na-agba etu a ga-esi agbapụta ụmụaka ji otu afọ efe alaa nna ha bụ ndị a tọọrọ na nsonso n' dị n'Imo steeti.
Makinde kwukwara na ya na ndị ọrụ nchekwa na steet Oyo nakwa Imo steeti na akpakwa maka otu ihe ahụ.
N'ozi mgbasaozi nke Kọmishona steeti ahụ na-ahụ maka mgbasaozi bụ Dotun Oyelade binyere aka ma wepụta , Makinde kwuru na Oyo steeti dị njikere isi ụzọ e siri gbapụta ndị a tọrọburu n' Oriire dị n'Oyo steeti were gbapụta ndị a ndị ntọ ji eji kemgbe abalị ise gara aga.
Ozi ahụ gara n'ihu sị, "Gọọmentị agaghị agba ama usoro a na-agbaso n'okwu nchekwa dịka nke a n'ihi na ụdị mkpughe ahụ nwere ike imebi ihe."
Ndị ojiegbe wakporo ụgbọala abụọ si Ibadan aga Ọwụwa Anyanwụ n'abalị mbụ nke ọnwa Oktoba afọ 2026, tọọrọ mmadụ 19 bụ ndị ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ji otu afọ efe ala na-aga Akwa-Ibom nakwa Abịa Statemo n' Umunoha dị n'okporoụzọ e si Owerri gawa Onitsha
Ndị ntọ ahụ kpọburu ndị nwee ndị ha tọọrọ ma na-ekwu ka e nye ha nde naira iri ise, iri ise n'isi ndị ja ji nke pụtara otu ijeri naira(N1Bn) mana ha mechara wetuo ya ka ọ bụrụ Nde naira ise(, nde naira ise(N5Million)
Anyị enyopụtala ebe ndị ntọọ ahụ jichiri ndị 'corper- Kọmishoba uweojii Imo steeti
Kọmishoba uweojii Imo steeti bụ Audu Garba Bosso, kwuru na ha amaala imi n'ala ma sipụta ebe ndị ntọ jichiri ụmụ NYSC ahụ n'ọhịa na steeti ahụ.
Bosso kwuru na ihe ndọchigha aka dị na ịzọp uta ụmụaka ndị a bụ na e nwere ogbunigwe e ji kwee ọnyịa na gburugburu ahụ.




























