Anyị napụtara mmadụ 10 anyị hụrụ ebe ndị ojiegbe tọọrọ ndị njem – Ndị uweojii Imo Steeti

Okporoụzọ Owerri-Onitsha Road na ndị uweojii Imo Steeti
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị uweojii Imo State ekwuola na ndị ọrụ nchekwa napụtara ndị njem iri oge ha jiri ọsọ gbagaa ebe ndị ojiegbe tọọrọ ndị njem n'okporoụzọ siri Owerri gawa Onitsha, ma kwuo na ha ka na-agba mbọ ịmata kpọmkwem mmadụ ole a tọọrọ.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye nyere nkọwa a oge ya na BBC nwere mkparịtaụka n'ekwentị n'ụbọchị Fraịde 2 Ọktoba 2026.

Okoye kwuru na ndị njem ahụ a tọọrọ gụnyere ndị ntoroọbịa na-efe ala nna ha nakwa ndị ọzọ, bụ ndị si Ibadan dị n'Oyo Steeti na-aga Uyo dị n'Akwa Ibom Steeti nakwa Bende dị n'Abia Steeti.

Dịka Okoye siri kọwaa, ndị ojiegbe wakporo ụgbọala bọọsụ abụọ bu ndị njem n'Umunoha dị n'okpuru ọchịchị Mbaitoli n'Imo Steeti mgbe o jiri ihe dịka ọkara gaa elekere isii nke ụtụtụ n'ụbọchị Tọzde 1 Ọktoba 2026.

"Ka m gwa gị nke bụ eziokwu, o nwereike ịbụ na mgbe ntọrị ahụ na-eme, ụfọdụ ndị njem gbapụrụ n'aka ndị ojiegbe. O nwereike ịbụ na ụfọdụ gbara ọsọ gaa zoo onwe ha n'ime ọhịa, ma jiri maka ụjọ nọrọ ebe ahụ," ka Okoye kwuru.

N'ịga n'ihu, ọ sịrị "Oge ndị ọrụ anyị nụrụ gbasara ya, ha jiri ọsọ gaa ebe ahụ, ma napụta ndị njem iri, dịka ha butekwara ụgbọala bọọsụ abụọ."

Ka ọ dị, akụkọ na-efegharị ebe niile kwuru na a tọọrọ ndị ntoroọbịa iri abụọ na-efe ala nna ha n'oge ndị ojiegbe mere mwakpo ahụ.

A tọrọla mmadụ 19 gunyere ndị NYSC n'Imo state

Eserese ndị bu egbe

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na a tọrọla mmadụ ruru 19, ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ji otu afọ efe ala nna Nigeria a kpọrọ 'NYSC n'ịchafụ.

A tọọrọ ha n'Ọgbakụ dị n'Imo steeti dịka Nigeria na-emerube emume ncheta afọ 66 ha nwetara nnwereonwe n'aka mba Briten.

Ọdachi a mere n'ụtụtụ Tọzde oge ndị ojiegbe wakporo ụgbọala abụọ nke ụlọọrụ njem 'Uko Akwa-Ibom Transport Limited' nke si Ibadan buru ndị njem gụnyere ndị ji otu afọ efe ala nna ha aga Ọwụwa anyanwụ ụbọchị Wenezde.

Ndị ntọ tọrọ ọtụtụ n'ime ha kpụrụ ha tibaa n'ime ọhịa.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe ndị e jiri osisi tuchie okporoụzọ, ụgbọala bọọsụ kwụsịrị akwụsị nakwa ndị mmadụ na igwe mmadụ gbakọrọ.

Onye nwe ụlọọrụ njem ahụ bụ Isaiaah Akpan gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ dachi ahụ bụ eziokwu.

ụgbọala na ndị uweojii

Akpan kwuru sị,"Ụgbọala m abụọ butere ndị mmadụ n'Ibadan n'abalị gara aga. Otu n'ime ha na-aga n'ogige ndị NYSC n' Akwa-Ibom nke abụọ na-aga na NYSC camp n'Imo steeti.

"Ha abụọ ruru Onitsha n'abali n'ihe dịka elekere itoolu mana n'ụtụtụ taa ka ha bidoro njem ha atọrọ ha n'ebe Ogbaku n'Imo steeti"..

"Ụgbọala abụọ ahụ nwere ndị njem iri na ise. Ndị tọọrọ ha kpọọrọ ndị njem niile nọ n'otu ụgbọala ahụ, ma kpọọrọ mmadụ anọ n'ụgbọala nke abụọ." "Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị a tọọrọ bụrụ mmadụ iri na itoolu."

Igwe mmadụ gbakọrọ ka m mkpamkpa ahụ kpachara
Nkọwa foto, Igwe mmadụ gbakọrọ ka m mkpamkpa ahụ kpachara

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na a tọọrọ ndị 'corper' na-eme njem ma kwuo na "ugbua anyị nọ n'isi ihe na-eme".

"Ndị uweojii na-agba mbọ ugbua ịzọpụta ndị a tọọrọ, ma jide ndị kpara mkpamkpa ahụ.