Lionel Messi awụsala ọwa n'ịgbara mba ya bụ Argentina bọọlụ

Lionel Messi gbarala mba ya bụ Argentina asọmpi ikpeazụ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye ọgbaa bọọlụ a ma ama n'ụwa niile bụ Lionel Messi akwụsịla igbara mba ya bụ Argentina bọọlụ n'ụzọ kwesịrị ekwesị dịka o nyere goolu n'asọmpi dị n'etiti mba Argentina na Benin Republic n'ụtụtụ Wenezde 7 Ọkọtoba 2026 bụ nke ha gbara n'ama egwuregwu Buenos Aires.

Lionel Messi bụ onye dị afọ 39, bụ onye gbara asọmpi mba na mba nke 208 na nke ikpeazụ ya, gbara penaliti e nyere mba Argentina n'ọkara nke abụọ nke asọmpi ahụ iji nweta goolu nke 125 ya n'asọmpi mba na mba niile ọ gbara mba ya bụ Argentina.

Tupu nke ahụ, o nyere onye nyere goolu bụ Nicolás Otamendi na Nico Paz aka bụ nke mere Argentina jiri merie n'asọmpi ahụ nke ha ji ọkpọ goolu atọ 3-0 nke mba Benin na-asataghị otu.

Cheta na Messi kwupụtara maka ịla ezumike nka n'ịgbara mba ya bụ Argentina bọọlụ n'ọnwa Ọgọst.

Messi gbara nkeji iri itoolu zuru ezu n'ihu ndị na-ekiri asọmpi ahụ ruru puku mmadụ (85,000) juputara n'ama egwuregwu 'Monumental'.

Mgbe asọmpi ahụ gachara, e mere ihe ngosi ọkụ bụ nke a kpọrọ 'laser light show' n'olu bekee, ịkụ egwu na mmemme pụrụ iche ndị ọzọ iji sọpụrụ ya.

Messi gwakwara ndị mba ya na ndị na-akawdo ya okwu ikpeazụ n'ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nkeji iri, ebe ụfọdụ ndị otu ya, gụnyere Enzo Fernández na-agbara otu egwu bọọlụ Manchester City bọọlụ, nọ na-akwa akwa ka Messi kwetara na ọ chọghị ịhapụ otu egwuregwu mba ya.

Agbanyeghị na ịgba ọrụ bọọlụ ya ga-aga n'ihu na klọb ya bụ Inter Miami nke na-agba bọọlụ na 'Major League Soccer (MLS)' nke mba America, ebe o nwere nkwekọrịta ịgbara ha bọọlụ ruo ngwụcha oge egwuregwu nke afọ 2028.

N'abalị emume ahụ malite ruo ngwụcha ya n'isi obodo Argentina, a na-ahụkarị Messi ka mmetụta uche na-emetụta ya nke ukwuu.

A hụrụ ya n'onyonyo ka ọ na-ehichapụ anya mmiri n'ụgbọala otu ha na-aga ama egwuregwu, ma e mechaa, mmetụta uche jidere ya mgbe a na-agụ ukwe nke mba Argentina.

Tupu asọmpi ahụ amalite, e mere nnukwu emume ngosi ọkụ (fireworks) iji nabata ndị ọgbaa bọọlụ n'ụlọ egwuregwu ahụ. A gbasakwara nnukwu uwe egwuregwu Argentina n'elu ahịhịa egwuregwu ahụ, nke nwere akara nọmba 10 a ma ama bụ akara uwe nke Messi bụ nke e dere "gracias" na ya nke pụtara "daalụ".