Etu ọkụ si 'tanker' mmanụ ụgbọala si gbaa ọtụtụ mmadụ, bibie ọdọahịa na Benin

Tanker gbara ọkụ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọkụ nwuuru dịka 'tanker' bu mmanụ ụgbọala dara na nso ahịa n'ahịa Oluku dị na Benin, n'okporoụzọ awara awara si Benin gawa Lagos gbara ọtụtụ ndị mmadụ ma bibie ọtụtụ ihe gụnyere ọdọahịa na ụgbọala

Ndị uweojii steeti ahụ kwuru na'ozi ha wepụtara na mmadụ asatọ merụrụ ahụ, ụgbọala abụọ gbapịa, ebe e bugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwu 'University of Benin Teaching Hospital' ebe ha na-enweta nleta.

N' ụbọchị Tozde, ọkụ nwuru dịka ndị mmadụ na-eku mmanụ ụgbọala sitere n' ụgbọala 'tanker' bu mmanụ ụgbọala gharịpụrụ n'okporoụzọ, daa, ihe dị n'ime ya wufuo, oge o ji ọkara gafee Elekere asaa nke ụtụtụ(7.30 am.)

Mana ọkụ nwuuru ebe Elekere 11 nke etiti ụbọchị.

Ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ndị mmadụ ọkụ gbachara akwa ha yi n'ahụ, ahụ ha wochap nakwa ụgbọala na ọdọọhịa na-agba ọkụ.

Ebe ọkụ gbara n'Ahịa Oluko dị na Benin, Edo Steeti

Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Eno Ikoedem binyere aka ma wepụta kọwara na "ndị uweojii zigara ndị otu ha ebe ahu iji hu na ọdachi ahụ apụtaghị ihe ọzọ, ebe ụlọọrụ gbata gbata nke 'Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas (NUPENG) bịara ma si n'ụgbọala dara ada na-gbanye mmanụ n'ụgbọala gwomgworo ọzọ tupu ọkụ nwuru ma fesa n'akụkụ ahịa .

" Ọ dị mwute na ebe Elekere 1150hrs, ọkụ nwuru na ụgbọala 'truck', ebie akụkụ ahịa, gbaa ụgbọala abụọ, otu Audi saloon car na ụgbọala 'truck'.

" Ọkụ merụụ mmadụ asatọ ahụ, e buga ha ngalba gbatagbata nke ụlọọgwụ 'University of Benin Teaching Hospital' (UBTH), ebe ha na-anata nleta.

Ebe ọkụ na-agba

Ndị uweojii gara n'ihu gbaa ama na ndị ọrụnchekwa gụnyere ndịagha, ndị nche "Edo State Security Corps' jikọrọ aka ịhazi ka ihe si aka iji mee ka ebe ahu ihe mere dajụọ.

Ugbọala bu mmanụ ụgbọala ịda n'okporoụzọ abụghị ihe ọhụrụ na Naijiria nke ndị mmadụ ị ga-ku mmanụ ụgbọala ji abụ.

Ụgboro ugboro, ụgbọala bu mmanụ ụgbọala adaala, ebe ọtụtụ mmandụ bụ ndị ji ji n'ihi ụbịam tunyere ndụ ha ebe ha gara iku mmanụ.