Bishọp Matthew Kukah: Na ntuliaka 2027, tụọ nụ vootu 'ka unu dị ndụ'

Bishop Matthew Kukah nke dayosis ụka Chatolic na Sokoto steeti
Nkọwa foto, Bishop Matthew Kukah
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Bishọp Chatolic dayosis na Sokoto steeti bụ Matthew Kukah ekwuola na etu ụmụ Nigeria si tụọ vootu na ntuliaka afọ 2027 na-abịa abịa ga-ekpebi 'na ha achọrọ ịdị ndụ'.

Bishop Kukah mere ka a mata nke a mgbe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ maka ntuliaka Nigeria ga-eme n'afọ 2027.

Kukah gwara ndị na-eto eto ka ha "tụọ vootu ga-eme ka ha dị ndụ".

N'okwu ya "anyị nwereike ịta ụlọọrụ INEC ụta, anyị nwereike ịta gọọmenti maọbụ ndị ọrụ nchekwa ụta; mana ikpeazụ onweghị onye tinyere gị egbe n'isi na-agwa gị tinyere onye nke a maọbụ onye nke ọzọ vootu".

"Ihe anyị kwesiri ime dịka ịntaneti dị ugbu bụ mgbe ọbụla m maọbụ onye ọbụla kwuru na ya chọrọ ịụ gọvanọ maọbụ Onyeisiala maọbụ onye omeiwu biko gaa n'ịntaneti, gụọ maka m".

"Gụọ ihe m mepụtagoro. Mara ọtụtụ maka m".

Ndụmọdụ m na-enye ndị na-eto eto

Bishọp Kukah gara n'ihu nye ndị na-eto eto ndụmọdụ ma sị "biko nu tụọ nụ vootu ka unu dị ndụ".

"Maka na ọ bụ anyị niile ga-ata ahụhụ maọbụ rie uru mkpụtara ihe ọbụla anyị mere".

Maka na aka anyị niile adịghị ọcka dịka anyị chere na anyị dị".