Peter Obi akatọla njide ndị otu 'Obidient Movement' n'Akwa Ibom state

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook
Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Nigeria ji otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigeria Democratic Congress (NDC) bụ Peter Obi akatọla njide e jidere ụfọdụ ndị so n'otu na-akwado ya a na-akpọ Obidient Movement nakwa 'Ok Movement'.
Ndị uweojii jidere ndị so n'otu abụọ ahụ mgbe ha mere ngagharị n'ụbọchị nnwere onwe Nigeria bụ Ọktoba 1, 2026 n'Akwa Ibom Steeti.
Peter Obi kọwara nke a dịka ọnọdụ megidere ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa iwu Nigeria.
Maadụ abụọ so na ndị e jidere bụ Elijah Noah, onye nhazi Obi-Kwankwaso Movement n'Akwa Ibom steeti nakwa Dọkịta Ben Smith bụkwa onye nhazi 'Obidient Movement' na steeti ahụ.
Mana ndị uweojii jidere Smith mgbe ya na ndị ọzọ gara ịchọ ka a tọhapụ ndị otu ha e jichiri n'ụlọọrụ ndị uweojii dịka ndị 'Obidient Movement si kọwaa'.
Ịdọ aka na ntị Peter Obi nyere

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook
N'okwu Peter Obi bipụtara n'akara X ya n'ụbọchị nnwereonwe Nigeria ka o kwuru sị "Nigeria enweghị isi ma ọ bụrụ na ụmụ amaala enweghị ike ikwu uche ha n'enweghị egwu maọbụ mgboch".
O kwuru na akụkọ banyere "njide a na-enjide ụmụ Naịjirịa maka ịgosipụta onwe ha dịka ndị otu 'Obidient Movement' kwesịrị ichegbu onye ọ bụla kwenyere n'ọchịchị onye kwuo uche ya na nnwere onwe".
Obi kwuru na "nnwere onwe Naịjirịa kwesịrị ịpụta nnwere onwe pụọ n'egwu, wepụ ikpe na-ezighị ezi, enweghị ndidi, na iji akaike achị ọchịchị, ma na-eme ihe n'ụzọ na-ezighị ezi.
Nkọwa ndị 'Obidient Movement' yere

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook
Otu 'Obidient Movement' n'ozi ha katọkwara njide ndị ahụ dịka mbọ e ji gbochie ụmụ amaala ikwupụta echiche ndọrọndọrọ ọchịchị ha.
Otu ahụ kpọrọ oku ka a tọhapụ ndị otu ha nọ n'aka ndị uweojii, ma kwụsị ihe ọ kọwara dịka iyi egwu na mmekpa ahụ a na-eme ndi otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị na-akatọ gọọmentị.
Ihe ndị uweojii kwuru maka nke a
Ndị uweojii kwuru na ha mere nke a n'ihi ozi ha nwetere gbasara ngagharị otu ahu ma kwuo na o nwereike ịbute ọgbaaghara.
Ha kwuru na e jidere mmadụ asatọ n'ihi nnupụ isi n'iwu a tiri ka e yigharịa mmemme ndọrọndọrọ ọchịchị niile n'ụbọchị ahụ.
Na nzaghachi, ndị uweojii kwuru na mkpebi ha emetụtaghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ bụla, kama na ọ bụ maka nchebe ọha.
Kọmishọna ndị uweojii na Akwa Ibom bụ Baba Azare, kwuru na ha gwara ndị haziri ngagharị ahụ ka ha yigharịa ya n'ihi na enwere ike inwe esemokwu n'etiti ya na ọgbakọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ.
O kwuru na ndị gara n'ihu na ngagharị ahụ n'agbanyeghị iwu ndị uweojii bụ ndị e jidere maka nyocha, nakwa na a ga-ekpe ha ikpe ma ọ bụrụ na achọpụta na ha mebiri iwu.




























