You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Amerịka agwala ndị ọrụ ha n'Abuja ka ha kwakọrọ pụọ na Naịjirịa
Gịnị mere ụlọnnọchiteanya Amerịka dị n'Abuja jiri gwa ndị ọrụ ha ka ha pụọ na Naịjirịa?
Mba Amerịka agwala ndị ọrụ ha n'ụlọnnọchiteanya ha a kpọrọ Embassy dị n'Abuja, isiobodo Naịjirịa ka ha si na Naịjirịa pụọ n'ihi ajọ ọnọdụ nchekwa a na-enwe na Naịjirịa na nso nso a.
Ndụmọdụ mba Amerịka nyere bụ maka ndị ọrụ ha na-abụghị ndị ọrụ gbatagbata nke bekee kpọrọ Emergency workers'.
Akwụkwọ ozi ụlọnnọchiteanya Amerịka dị n'Abuja wepụtara n'ụbọchị Wenezde abalị asatọ nke ọnwa Eprel, 2026, gwara ụmụafọ mba Amerịka ka ha ghara ịga mba Naịjirịa maka ọtụtụ mwakpo, ntọrị, ngagharịiwe nakwa ajọ ọnọdụ ụlọọrụ ahụike na Naịjirịa.
Ụlọnnọchiteanya ahụ agwaghị BBC oge ndị ọrụ ha ahụ ga-ahapụ Naịjirịa.
Ha agwaghịkwa anyị ma ndụmọdụ a ọ bụ naanị maka ụmụafọ Amerịka na-arụ ọrụ n'ụlọnnọchiteanya ahụ ka o metụtakwara ụmụafọ Naịjirịa bụ ndị ọrụ ha.
Akwụkwọ ozi ahụ gụpụtara steeti iri abụọ na atọ na Naịjirịa a dọrọ ụmụafọ Amerịka aka na tị ka ha ghara ịga.
Ụfọdụ steeti ndị a gụnyere Plateau, Jigawa, Kwara, Niger na Taraba steeti.
Ndị ọzọ bụ Kano, Borno na Yobe steeti bụ ebe otu na-eyi egwu dị cihe iche wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ gụnyere ndịagha na ndị nkịtị.
Mba Amerịka kwuru na mwakpo ndị a na-emekarị n'ọdọ ahịa, ụlọakwụkwọ, ụlọụka, ọdọụgbọala nakwa ebe a na-eme ọgbakọ.
Ndụmọdụ a na-abịa n'agbanyeghị mbọ niile Naịjirịa na-agba iji wụlite mmekọ ha na mba Amerịka n'ihe gbasara nchekwa.
Onye maara ihe ekwa na-akụ banyere nchekwa bụ Patrick Agbambo gwara BBC Igbo na ndụmọdụ ahụ Amerịka nyere bụ nke gosiri na mba Amerịka enweghịzi ntụkwasiobi na Naịjirịa nwereike ichekwa ụmụafọ ha.
N'okwu ya 'Ihe ndụmọdụ a Amerịka nyere pụtara bụ na ọnọdụ nchekwa akpụọla afọ n'ala na Naịjirịa na nke ikpeazụ a".
O kwuru na ndụmọdụ ahụ Amerịka nyere ndị ọrụ ha gosiri na Amerịka chọrọ ichekwa ụmụafọ ha niile nọ na Naịjirịa ma megide ihe mgbu ọbụla nye ha.
Ka ọ dị ugbua, gọọmenti Naịjirịa ekwubeghị ihe ọbụla banyere ndụmọdụ a mba Amerịka nyere ndị ọrụ ụlọnnọchiteanya ha dị n'Abuja.