Kedụ uru ọwa mmiri ‘Strait of Hormuz’ bara?

Kedụ uru ọwa mmiri ‘Strait of Hormuz’ bara?

Esemokwu nke malitere site na mwakpo mba Amerịka na Izrel jikọtara ọnụ mee n'ime Iran na Febụwarị 28, 2026, kpatara ọgbaghara n'ofe 'Middle East'.

Ka nke a mere, Ịran gara n'ihu họpụta nwa Ayotollah Khamenei bụ Mojtaba Khamenei dịka onyendu ọhụrụ.

Tehran kwere nkwa na ha ga-akwụghachi mwakpo e mere ha, mana kama ịtụ ogbunigwe naanị n' Izrel, ogbunigwe Iran emeela ka obodo dị iche iche maa jijiji site na Doha ruo Abu Dhabi, Dubai, obodo Kuwait ruo Manama na Riyadh.

Ịran gakwara n'ihu machie ọwa mmiri Strait of Hormuz nke gbochiri ụgbọmmiri bu mmanụ agbidi ịgafe.

Kemgbe ha mechiri ọwa mmiri ahụ, ọnụahịa mmandụ agbidi arịala na mba dị iche iche n'ụwa niile.

Mana Onyeisiala Donald Trump nọrọ n'ụbọchị Satọde 4 Eprel, 2026 nye mba Ịran abalị abụọ ka ha mepee ọwa mmiri Strait of Hormuz.

Trump kwuru na ọ bụrụ na Ịran emepeghị ọwa mmiri ahụ, na ọ ga-awakpo ha n'ụdịrị ha ahụtụbeghị.

Cheta na mbọ niile a na-agba inweta udo n'ọgụ ahụ amịtabeghị mkpụrụ ọbụla.

Ka ọ dị ugbua, Ịran mere ka o doo anya na ha ga-emegwara mwakpo ọbụla mba Amerịka maọbụ mba Izrel ga-eme n'ogige akụrụngwa mmanụ agbidi ha ọbụla.