You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Eprel 2, 2026
Akụkọ dị mkpa - Eprel 2, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola na ọ ga-aga Jos isiobodo Plateau Steeti iji tie ezinaụlọ ndị ahụ e gburu na mwakpo tara isi mmadụ karịrị iri abụọ aka n'obi.
- Onyeisiala Tinubu kwere nkwa na ndị ahụ kpara arụ a agaghị ala n'efu ma kwuo na gọọmenti ya ga-aga n'ihu na-echekwa obodo Naịjirịa niile.
- Ndị ojiegbe mere mwakpo ahụ n'ụbọchị Sọnde 29 Maachị, 2026, gbuo ndị mmadụ karịrị iri abụọ n'obodo Gari Ya Waye nke Angwan Rukuba.
- Pati African Democratic Congress (ADC) nke David Mark nọ n'isi ya akatọọla mkpebi ụlọọrụ Independent National Electoral Commission kpebiri ịkwụsị ịnabata David Mark dịka onyeisioche pati ADC.
- Ọnụ na-ekwuru pati ADC bụ Bolaji Abdulahi kwupụtara nke a ma kọwaa na gọọmenti etiti bụ ihe kwanyere ụlọọrụ Inec iji kpebie nke a maka na ha hụrụ na nkwado ADC na-enweta na-abanwanye na Naịjirịa niile gbaa gburu gburu.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.