Ebuka Obi naara anyị ala anyị n’ike – Ndị Ngọ Ọkpala

Ebuka Obi naara anyị ala anyị n’ike – Ndị Ngọ Ọkpala
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Ndị Ngọ Ọkpala dị n'Imo Steeti akọwaala na onye oziọma a ma ama bụ Ebuka Obi nke ụka Zion Ministry ji aka ike nara ha ala o ji wuo ụlọụka ya.

Ha nyere nkọwa a oge Eze, ndị na-eso Eze achị, ndị obodo Ngọ Ọkpala na ụlọọrụ BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche.

Eze obodo Eziama dị na Ngọ Ọkpala bụ Hiacynth Nwamadi kwuru na ndị Chaịna bịara n'obodo ha n'afọ 2006 ma kwuo na ha chọrọ iji ala ha dị puku hekta abụọ wuo ụlọọrụ, nke ha kpọrọ Guangdong Free Trade Zone.

"Ha gakwuuru gọọmenti, ha na ndị gọọmenti esoro bịa. Oge ha bịara, anyị hiwere kọmitii. Ha wetere akwụkwọ nye ndị Guangdong na ndị gọọmenti, sị ha lekwa ihe ndị anyị chọrọ. Ihe a bụ ihe ndị e nwereike ime ka ọ dị mma. Oge ahụ echibeghị m Eze ndị Eziama."

Eze Hiacynth Nwamadi kwuru na e binyebeghị aka n'akwụkwọ ahụ iji mara ndị a nabatara nakwa ndị a na-anabataghị ruo mgbe ndị Guangdong lara.

Ọ kọwara na ndị ụlọọrụ Guangdong lara, ndị nwe ala gara wereghachi ala ha ma jiri ya na-akọ ugbo.

Dịka Eze Hiacynth Nwamadi siri kwuo, ọ bụ n'ụbọchị 18 Jenụwarị 2024 ka onye otu Ebuka Obi aha ya bụ Kennedy bịara gwa ya na ha nwere mmasị n'obosara ala ahụ.

"M sị ha "ọ dị mma" ma gwa ha gakwuru gọọmenti. Otu ụbọchị, ha kpọrọ anyị oku n'Obieze Imo, anyị agaa. Ha asị anyị lawa, na anyị na gọọmenti ga na-enwe nzukọ site na mgbe ruo na mgbe, iji mara etu a ga-esi mee ya ka ọ gaa nke ọma. Agwara m ha sị ebe ọ bụ na e kpebiela na anyị na gọọmenti ga na-ezukọ kwa mgbe kwa mgbe, ọ ga-adị mma ka ha na-abịa n'obodo anyị".

"N'ụbọchị ọzọ, ha asị anyị hiwe kọmitii ga-edepụta nkwekọrịta a ga-enye gọọmenti. N'eziokwu, ha dere ya ede. Ụbọchị a kpọrọ anyị oku, ha sịrị anyị nyefee nkwekọrịta ahụ n'aka Mịnịstrị na-ahụ maka ala n'Imo Steeti, dịkwa ka anyị mere etu ahụ".

"Obodo ndị nyere gọọmenti nkwekọrịta ha gụnyere Ntu, Eziama, Amala, Atia na Ikem. Anyị nwere obiụtọ, ma were ya nye ndị ụka Zion Ministry site n'aka nwoke ahụ sị na ya bụ Fada Kennedy".

"Anọzi m otu ụbọchị, nụ ka a sị na gọọmenti enyela ndị ụka Zion Ministry ikike inwe ala (Certificate of Occupancy). Ọ tụrụ m n'anya n'ihi na gọọmenti ewerebeghị ala anyị. Anyị nọzi, e buru nnukwu ụgbọala caterpiller na bulldozer bata n'obodo anyị tinyere ọtụtụ ndịagha bu ngwaọgụ. O nweghị mkparịtaụka anyị na gọọmenti maọbụ Ebuka [Obi] nwere."

O boro ebubo na a na-eyija ndị obodo ya aghara aghara, ma kwuo na nkwekọrịta ha na Ebuka Obi nwere bụ na ọ ga-arụrụ ha ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ, ụlọ ahụike, ahịa na ụlọọrụ dị iche iche, mana naanị ihe ha na-ahụ ugbua bụ sọọsọ ụlọ oriri.

Otu onye obodo kwuru okwu sị na e mebiri akpụ ndị ha kọrọ n'ubi nakwa akụmakụ ha ndị ọzọ, ma kwuo na ndị bu ngwaọgụ na-eyi ha egwu oge niile.

Onye nke ọzọ kwuru na di ya nwụrụ afọ iri na otu gara aga, dịka ọ bụ ubi ahụ nne di ya na-enye ya ka o ji azụ ụmụ ya ma na-elekọta ezinaụlọ ya.

Otu n'ime ndị ndu ndị ntoroọbịa kọwara na ha emeela ngagharịiwe n'ụzọ udo iji mee ka gọọmenti mara gbasara nsogbu dị n'etiti ha na Ebuka Obi.

Ka o sina dị, Ebuka Obi kwuru na ya na ndị Ngọ Ọkpala nwere nkwekọrịta tupu ọ malite iwu ụlọụka n'obodo ha.