E meghị ka ụmụnwaanyị dịnara ala n'azụ ha ma ha chọrọ ịmụ nwa

E meghị ka ụmụnwaanyị dịnara ala n'azụ ha ma ha chọrọ ịmụ nwa
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist

Kedụ ka ọ ga-adị gị ma ị gara ịmụ nwa n'ụlọọgwụ dọkịta asị na gị edinakwala n'elu akwa ụlọọgwụ?

Mgbe ọbụla ị ṅụrụ na nwaanyị chọrọ ịmụ nwa, ihe na-abịa gị n'obi bụ idina ala n'elu akwa n'ụlọọgwụ mana nke ahụ abụghị etụ esi amụ nwa n'oge mbụ.

Oge mbu, enwere ụzọ dị iche iche nwaanyị ji amụ nwa dịka igbu ikpere n'ala, itukwuru ala, iji oche eji amụ nwa maọbụ inọdụ ọdụ ma tụgharịa n'akụkụ.

Nkea na-enye aka ka ịmụ nwa adị nfe.

Mana gịnị mere ụmụnwaayị ji edina n'ala amụ nwa ugbua?

Janet Balaskas onye guzobere ụlọọrụ 'Active Birth Centre' na Yurop si na ụmụnwaanyị idina ala amụ nwa na-eme ka ịmụ nwa bụrụ ihe mgbagwoju anya ma bụrụkwa nke ọnụego ya dị ukwuu.

Akụkọ kwuru na ọ bụ otu nwoke aha ya bụ Francois Mauriceau onye amala Fransị gbanwere usoro ụmụnwaanyị ji amụ nwa na mbu.

O kwuru na idina ala amụ nwa ga-adịrị nwaanyị ahụ mma ma dịrịkwa dọkịta nwoke mfe inyere ya aka ịmụ nwa.

O nwere ndị sị na ntụgharị usoro ụmụnwannyị ji amụ nwa bụkwa n'ihi nwoke ọzọ bụ onye amala mba Fransị aha ya bụ Eze Lous nke iri anọ.

Lauren Dundes, ọkammụta n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke bekee kpọrọ 'sociology' sị na eze ahụ na-enwe obi ụtọ ikiri ụmụnwaanyị ma ha na-amụ nwa mana obi gbawara ya maka ụmụnwaanyị tụgharịrị na-amụ nwa site n'ụzọ ndị ọzọ nke mere o ji kwalite ụdị ọhụrụ nke bụ idina ala amụ nwa.

Sayensi kọwara n'ihe mere ụmụwaanyị ji amụ nwa oge mbu site na igbu ikpere n'ala ma ọ bụ itukwuru ala bụ na ọ na-enyere nwata dị n'afo nne ya aka ime njem site n'ime ahụ nne ya gbatuo ebe nwa kwesịrị isi apụta.

Ọ na-enye kwa aka ibeleta iwa afọ maka ikupụte nwa nọ n'afọ.

Kedụ ihe ị nwere ikwu maka nkea?