You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nkwa Onyeisiala Bola Tinubu kwere ndị obodo Jọs na njem nleta ya
Onyeisiala Bola Tinubu gara leta ma tie ezinaụlọ ndị ahụ e gburu ndị nke ha oge ndị ojiegbe mere mwakpo na Jos dị na Plateau Steeti, ma kwee nkwa na ụdị ọnọdụ ahụ agaghị adapụta ọzọ.
Cheta na ndị ojiegbe wakporo obodo Angwan Rukuba dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Jos North na Plateau Steeti n'ụbọchị Sọnde 29 Maachị 2026, gbuo ihe karịrị mmadụ iri abụọ na asatọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.
Oge ọ na-agwa nwaanyị ahụ a hụrụ n'onyonyoo ebe o ku ozu nwa ya n'aka okwu, Tinubu sịrị: "Amaara m ihe mgbu ị na-agabiga, ahụrụ m etu i siri kuru ozu nwa gị n'ahụ ma nwee oke mwute n'obi gị. Naanị Chineke nwereike inye gị ọṅụ na nkasiobi. O nweghị ọṅụego ọbụla pụrụ iweghachi ihe funahụrụ gị. Dịka gọọmenti, anyị ga-agbali ike anyị iji kwado ma tie gị aka n'obi."
Eze ọdịnala Jos a maara dịka Gbong Gwom Jos bụ Da Jacob Gyang Buba na Simon Bako Lalong bụbu Gọvanọ Plateau steeti, ji ohere ahụ rịọ Onyeisiala Tinubu arịrịọ ka o nye ndịisi steeti ahụ ohere ka ha na ya nwee mkparịtaụka iji chọpụta ụzọ ka mma iji gbochie mwakpo ndị ojiegbe na-eme na Plateau steeti kwa mgbe kwa mgbe.
Ndị ojiegbe awakpola ma gbuo ọtụtụ puku mmadụ ma mebie ọtụtụ ụlọ, ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ n'oge gara aga nke mere ka ụfọdụ ụmụafọ afọ steeti ahụ gbaa ọsọ ndụ na steeti ndị ọzọ dị iche iche.