Ihe mere e ji gbachie ụlọụka Catholic na Benue state

Aha onyonyo, Ihe mere e ji gbachie ụlọụka Catholic na Benue state
Ihe mere e ji gbachie ụlọụka Catholic na Benue state
Mgbe e biputara ya

Ọ bụghịzi akụkọ ọhụrụ na ọkụ ogbụgba mebiri ihe n'ụlọụka Catholic dị n'obodo Ihugh, n'okpuru ọchịchị Vandekiya, Benue state.

BBC gara n'obodo ahụ imara nke bụ eziokwu dika Bishop ụka Catholic na Benue State bu Bishop William Avenya nyere iwu ka a gbachie St. Winifred Parish, Ihugh ma gbachie ụlọakwụkwọ ha bụ Saint Winifred Girls Secondary school nakwa ụlọọgwụ ha gunyere St. Thomas Hospital Ihugh, Salus mind care, Hospital Chaplaincy maka ọnọdụ nchekwa ha.

N'oge BBC gara n'obodo ahụ ka ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru ihe ha ma.

N'oge gara-aga ka e nwere udiri nsogbu a na "Oct 28 2025", "May 10th 2026," "May 15th 2026" nakwa "October 11th 2026" nke tinyere ndụ ụmụ akwụkwọ, ndị ụka na ndị nkuzi ha na nnukwu nsogbu".

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Benue State bụ DSP Orchie Peter kwuru na ha na-eme nnyocha ịchọpụta ihe butere ọkụ ogbụgba mebiri ihe n'ụlọụka ahụ.

Na ugbua ha amabeghi ma ọ bụ ndị omekome maọbu ihe mberede.