NNPC fuel price discount: "Mbelata ọnụego mmanụ ụgbọala NNC mere bụ maka ịkwalite azụmaahịa ha"

Aha onyonyo, NNPC fuel price discount: "Ibelata ọnụego mmanụ ụgbọala NNC mere bụ maka ịkwalite azụmaahịa ha"
NNPC fuel price discount: "Mbelata ọnụego mmanụ ụgbọala NNC mere bụ maka ịkwalite azụmaahịa ha"
Mgbe e biputara ya

Mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba na Nigeria bụ Ayodele Taiwo kọwara na mwepụ ego NNPC na-ewepụ n'ọnụego mmanụ ụgbọala bụ maka iji kwalite azụmaahịa ha na ọ bụghị iweghachite ego enyemaka gọọmentị na-akwụ maka ibelata ọnụego mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'subsidy'.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere ebe ọ kọwara ọnọdụ mere ụlọọrụ NNPC jiri malite atụmatụ ahụ. O kwuru na atụmatụ bụ ihe NNPC chọrọ iji nyere ụmụafọ Nigeria aka n'oge nchekwa afọ 66 Nigeria nweereonwe ya n'aka mba Briten.

Kama na gọọmenti hụrụ na atụmatụ ahụ dị mma ma gwa NNPC ka ha gbatịkwuo oge ya ruo otu ọnwa.