Etu ụmụnwaanyị Uburu si emepụta nnu site na Mmiri Mmahi

Aha onyonyo, Etu ụmụnwaanyị Uburu si emepụta nnu site na Mmiri Mmahi
Etu ụmụnwaanyị Uburu si emepụta nnu site na Mmiri Mmahi
    • Onye dere ya, Orji Nnachi
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter
  • Mgbe e biputara ya

Ụmụnwaanyị Uburu dị n'Ebonyi state akọwaala etu ha si emepụta nnu site n'iyi obodo ha a na-akpọ, Mmiri Mmayi.

Ha kọwakwara na mmiri nnu ahụ na-agwọ ha ọrịa dị iche iche, dịka ọ bụkwa ya ka ha ji asa ahụ.

Otu n'ime ụmụnwaanyị ahụ bụ bụ Mmahi Agwu kwuru sị,"Mmiri nnu anyị, mmiri nnu Uburu, a na-ekute ya, i tee ya n'ahụ, were ya saa ahụ, ahụ gị adị ọcha."

"Ana m ekute mmiri ahụ, m bia kwọchaa ya, were ya tinye n' ime mmiri,saa ahụ, ọ bụ ya bụ ncha m ji asa ahụ, ọ bụ ya bụ mmanụ m na-ete n'ahụ m".

"Ọ bụrụ na ukwu na-egbu gị mgbu dịka o si egbu m, a na m awụsa mmiri nnu ahụ n'ụkwụ m. Ozigbo m wụsara ya n'ụkwụ, m ga-ebili gaa ebe m chọrọ ịga. Ọ bụ ọrụ ya. Ọ bụ ya ka m ji eweliri nnu a aka elu, "

Otu nwaanyị bụ Mmahi Agwu kọwara etu o si malite isipụta nnu site na Mmiri Mmayi. Lee ihe ọ kọọrọ anyị:

"Mgbe m jiri malite isi nnu bụ mgbe Nne mụtara Nne m n'esi nnu. Mụ ma ya bi n'ụlọ, esoro m ya esi nnu, a na m enyere ya aka, n'ihi na a bụ m nwa nwa ya. Emecharam bụrụ agbọghọ bịa lụọ di, e bim ma be Nne nnem were lụọ di".

"Ọ na-abụ ọ nọọ ntakịrị oge, m haa ebe Nnem n'esi nnu nke ya nyere ya aka tupu ma laa. Amalitere m siwa nnu nke m. A tụọla m ntụ ime abụọ tupu m malite isi nnu."

Nwaanyị a kwuru na mgbe a gbara ọsọ agha, na ya na-esi nnu ebe ọ dị ukwuu, nke mere na ọ zụghị nnu n'ahịa oge niile a lụrụ agha.