Etu ụmụnwaanyị Uburu si emepụta nnu site na Mmiri Mmahi
- Onye dere ya, Orji Nnachi
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter
- Mgbe e biputara ya
Ụmụnwaanyị Uburu dị n'Ebonyi state akọwaala etu ha si emepụta nnu site n'iyi obodo ha a na-akpọ, Mmiri Mmayi.
Ha kọwakwara na mmiri nnu ahụ na-agwọ ha ọrịa dị iche iche, dịka ọ bụkwa ya ka ha ji asa ahụ.
Otu n'ime ụmụnwaanyị ahụ bụ bụ Mmahi Agwu kwuru sị,"Mmiri nnu anyị, mmiri nnu Uburu, a na-ekute ya, i tee ya n'ahụ, were ya saa ahụ, ahụ gị adị ọcha."
"Ana m ekute mmiri ahụ, m bia kwọchaa ya, were ya tinye n' ime mmiri,saa ahụ, ọ bụ ya bụ ncha m ji asa ahụ, ọ bụ ya bụ mmanụ m na-ete n'ahụ m".
"Ọ bụrụ na ukwu na-egbu gị mgbu dịka o si egbu m, a na m awụsa mmiri nnu ahụ n'ụkwụ m. Ozigbo m wụsara ya n'ụkwụ, m ga-ebili gaa ebe m chọrọ ịga. Ọ bụ ọrụ ya. Ọ bụ ya ka m ji eweliri nnu a aka elu, "
Otu nwaanyị bụ Mmahi Agwu kọwara etu o si malite isipụta nnu site na Mmiri Mmayi. Lee ihe ọ kọọrọ anyị:
"Mgbe m jiri malite isi nnu bụ mgbe Nne mụtara Nne m n'esi nnu. Mụ ma ya bi n'ụlọ, esoro m ya esi nnu, a na m enyere ya aka, n'ihi na a bụ m nwa nwa ya. Emecharam bụrụ agbọghọ bịa lụọ di, e bim ma be Nne nnem were lụọ di".
"Ọ na-abụ ọ nọọ ntakịrị oge, m haa ebe Nnem n'esi nnu nke ya nyere ya aka tupu ma laa. Amalitere m siwa nnu nke m. A tụọla m ntụ ime abụọ tupu m malite isi nnu."
Nwaanyị a kwuru na mgbe a gbara ọsọ agha, na ya na-esi nnu ebe ọ dị ukwuu, nke mere na ọ zụghị nnu n'ahịa oge niile a lụrụ agha.



