Etu aka NDLEA si kpara ụmụafọ Meziko nakwa ụmụafọ Naịjirịa na-esi mkpụrụmmiri
Ụlọọrụ na-ebu agha megide ọṅụṅụ na orire ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ekposaala ogige ebe a na-esipụta ọgwụike mkpụrụmmiri dị na mpaghara Ijebu nke Ogun Steeti.
Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Brigadier Gen Muhammed Buba Marwa kwuru na ogige a bụ ebe kachasị ukwuu a na-esipụta ọgwụike mkpụrụmmiri a na Naịjirịa, ma sị na ọ bụ n'ime okeọhịa ka e hiwere ya.
NDLEA kwuru na nke a bụ mkpụrụmmiri ọnụego ya kachasị ukwuu ha na-akpachi kamgbe e hiwere ụlọọrụ ha.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị na ndị a na-esipụta mkpụrụmmiri, kama na ha na-aga n'ihu na-ekesa ọgwụike a na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.
O kwuru na ha wakporo ogige ebe ahụ a na-esipụta mkpụrụmmiri a n'ụbọchị Satọde 16 Mee 2026 site na nnyocha ha mere kamgbe ọtụtụ ọnwa.
O kwuru na ha kpachiri mkpụrụmmiri ruru kilogram puku abụọ narị anọ na iri na itoolu nke ọnụego ya bụ narị ijeri naịra anọ na iri asatọ.
Ụlọọrụ a kọwara na ọ bụ mmadụ iri ka ha nwuchiri n'ogige ahụ, nke gụnyere ndị a kpọrọ Nwachukwu Sunday Christian, Igwe Abuchi Remigius, Ifeanyichukwu Chibuike Joshua, Egwuonwu Uchenna Victor na mmadụ atọ ndị ọzọ bụ ụmụafọ mba Meziko bụ ndị e bubatara Naịjirịa maka isi mkpụrụmmiri a.
Dịka ọ dị ugbua, ndị a a nwuchiri nọ n'aka ụlọọrụ NDLEA, bụ ebe ha na-ekwupụta ma na-akpọpụta aha ndị ọzọ bụ ndị otu ha.



