Ọ bụ m na-ahazi ejiji di m - Nwunye Olu of Warri

Aha onyonyo, 'Adị m ka ụmụnwaanyị atọ nye Olu of Warri'
Ọ bụ m na-ahazi ejiji di m - Nwunye Olu of Warri
Mgbe e biputara ya

Ihe kachasị amasị m dịka onye lụrụ Eze, maọbụ ka ọ si bụrụ onye a ma ama, bụ na m na-ahụ ka ụwa niile si eto ya maka nnukwu amamihe o nwere.

Mụ onwe m na-etokwa ya. Ọ bụ onye m ji eme ọnụ dịka mmadụ, nakwa ịhụ na obodo niile kwetere nke a na-enye m ọṅụ.

N'aka nke ọzọ, a sị na nri ọbụla dị ụtọ, oge ụfọdụ, ijiji na-achọ iri ya. O nwereike ịbụ ikekọrịta oge mgbe ụfọdụ.

Oge ụfọdụ ọ naghị enwe oge, ma ọ na-ewute ma ọ bụrụ na mụ na ihe ndị ọzọ na-ekekọrịta di m.

Nke ahụ nwereike ịbụ ihe siri ike mana anyị na-amụta ka anyị ga-esi gabiga ya, maka na oge ụfọdụ ana m achọ ka naanị mụ na ya nọrịa.

Oge ikpeazụ mụ na Eze kpara, o mere ka o doo anya na ya achọghị ọtụtụ nwunye.

Ugbua mụ na gị nọ, ọ bụrụ na ya gbanwee obi ya sị na ya adịla njikere, ị ga-ekwe ka ọ bụ na ị gaghị ekwe?

Nke mbụ bụ na Eze agaghị enweike gbanwee obi ya gbasara ịlụ ọtụtụ nwunye. Ka m hapụgodu nke ahụ ebe a. Naanị mụ onwe m dịka ụmụnwaanyị atọ. Ya mere, naanị m ezuola ya.