Ọ na-akara anyị mma ịnọrọ n'ụlọ oge anyị na-ahụ nsọ anyị
Ụmụakwụkwọ nwaanyị na Plateau Steeti na-anata ihe ndị e ji adị ọcha e si n'osisi unere mepụta.
N'akụkọ a BBC gbara ndị na-emepụ ihe a ji adị ọcha nakwa ụmụakwụkwọ ajụjụ ọnụ.
Ha kwuru sị "n'oge gara aga, ọ na-akara anyị mma ịnọrọ n'ụlọ oge anyị na-ahụ nsọ anyị..."
"Anyị anaghị esonye n'ihe omume nke ụlọakwụkwọ oge anyị na-ahụ nsọ anyị, n'ihi ụjọ na ọ ga-ete n'uwe anyị".
Nchọpụta gosiri na otu n'ime ụmụakwụkwọ iri n'Afrịka anaghị aga akwụkwọ oge ha na-ahụ nsọ ha.
Naanị na Naịjirịa, ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị nwaanyị karịrị nde iri atọ na asaa anaghị enweta ihe ndị e ji elekọta nsọ ha, n'ihi ụbịam.
Williams na-ekwu sị dịka onye nwere ọtụtụ ụmụnne nwaanyị,. ọ na-ewute ya ịhụ na o nwere ụmụnwaanyị ndị ka nọ n'oge a na-anaghị aga akwụkwọ maọbụ ọrụ n'ihi ihe si na chi dịka ịhụ nsọ ha.
Kirie onyo a ma chọpụta ka William si malitere Girlified bụ atụmatụ o ji enyere ụmụ nwaanyị aka.



