Iwu o gbochiri Gọvanọ Hope Uzodimma ịzọ ọkwa Sịnetọ?
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Kemgbe aka na-achị Imo Steeti bụ Hope Uzodimma kwupụtara mmasị ya ịzọ ọkwa Sịnetọ iji nnọchiteanya mpaghara Imo West n'Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria, ọtụtụ mmadụ anọrọla na mgbagwojuanya.
Ụfọdụ na-ajụ sị, kedụ ka ọ ga-esi kwe omume na gọvanọ ga-anọ n'ọchịchị zọọ ọkwa ọzọ, ma ọ ga-eburu eburu nyara anyara?
Ndị ọzọ a na-ebugharị akụkọ sị, ikekwe, ọ ga-agba arụkwaghịm ma nyefee ọchịchị n'aka osote ya, iji nweta ohere ịzọ ọkwa onye omeiwu.
Mana iwu Naijiria o gbochiri ya ime nke a?
Ndị Ọkaiwu abụọ bụ Obulimba Madukaji na Maxwell Opara kwuru hoohaa na o nweghị iwu ọbụla Uzodimma dara ma ọ bụrụ na ọ nọrọ n'ọchịchị dịka gọvanọ wee zọọ ọkwa ịbụ onye omeiwu.
Obulimba kwuru na oge ọchịchị Uzodimma kwesịrị ịkụrụ ọnụ dịka gọvanọ n'ọnwa Febụwarị afọ 2028 n'ihi oge ọ batara n'ọchịchị, mana mgbe a ga-ahazi ntuliaka maka ndị omeiwu bụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2027.
Ọ kọwara na naanị ihe Uzodimma ga-eme ma a sị ya nweta mmeri na ntuliaka ahụ bụ ịgbahapụ ọkwa ya dịka gọvanọ, ma gazie ṅụọ iyi dịka onye omeiwu.



