Arsenal ọ ga-ebuli iko 'English Premier League' afọ 2025/2026?
Ụgbọ asọmpi Premier League mba Ịngland na-agbazi kwara pụ kwara pụ, mana otu ajụjụ mmadụ niile kpụ n'ọnụ ugbua bụ ma otu egwu bọọlụ Arsenal nọ n'isi asọmpi ahụ ugbua, ha ga-etiwali akwa mgbochi ji ha kemgbe afọ 22?
Kemgbe e hiwere otu egwu bọọlụ Arsenal n'ọnwa Ọktoba afọ 1886, naanị ugboro atọ ka ha buru iko Premier League. Nke mbụ bụ n'afọ 1997 banyere 1998, nke abụọ bụ n'afọ 2001 banyere 2002, ebe nke atọ bụ n'afọ 2003 banyere 2004.
Mana otu njirimara Arsenal na nso nso a abụrụla na ha na- anọgide n'isi asọmpi Premier League ma gharịpụ ka ọ fọdụrụ ịmaaka ole na ole ka asọmpi kụrụ ọnụ.
Ụdị ihe a mere n'afọ 2015 banyere 2016, bụ mgbe ha mara afọ n'ala ka Leicester City buru iko. N'afọ 2022 banyere 2023, ha gbara ọnyụpa ka Manchester City turu ugo. N'afọ 2023 banyere 2024, ha tiwara ka akị oyibo Nsugbe iji nye ohere ka Manchester City buru iko, ebe n'afọ 2024 banyere 2025, ha gbahapụrụ aka ka nwa igu, iji bunye Liverpool iko.
Dịka a na-agba asọmpi Premier League nke afọ 2025 banyere 2026, Arsenal agakwaala rigoro n'isi asọmpi ahụ, dịka ha nwere akara 82 n'ịmaaka 37 ha gbarala, ebe Manchester City na-agba ndị nke abụọ nwere akara 77 n'ịmaaka 36 ha gbarala.
Ugbua, ọ fọdụla naanị otu ịmaaka ka Arsenal fanye egbe ha n'ọbọ n'ịmaaka nke afọ a, mana ọtụtụ mmadụ amalitela iche nakwa ikwu ihe dị iche iche. Ajụjụ wee bụrụ, Arsenal ọ ga-etiwali akwa mgbochi ji ha kemgbe afọ 22?



