Gọọmenti Naịjirịa asaala ebubo imefu ego na-anọghị na bọjetị

Aha onyonyo, Gọọmenti Naịjirịa asaala ebubo imefu ego na-anọghị na bọjetị
Gọọmenti Naịjirịa asaala ebubo imefu ego na-anọghị na bọjetị
Mgbe e biputara ya

Ụlọọrụ mbaụwa na-ahụ maka akụnaụba bụ International Monetary Fund (IMF) eboola ebubo na Gọọmenti Naịjirịa mefuru pasenti abuọ n'ego ọha bụ nke na-esoghị n'atụmatụ mkpata na mmefu ego ha kpọrọ "off-budget spending", bụ nke mere enweghị ntụkwasịobi n'usoro mmefu ego ji kawanye njọ.

Na nzaghachi, Gọọmenti Naịjirịa kwuru na o nweghị eziokwu dị n'ebubo ahụ. Minista na-ahụ maka ego bụ Taiwo Oyedele kwuru na Gọọmenti Etiti anaghị emefu ego ọha n'ụzọ iwu na-akwadoghị, kama, ego ọbụla ha mefuru bụ nke Ụlọomeiwu kwadoro.

Ọnọdụ a mere ka ụfọdụ ndị na-ama gọọmenti etiti aka gụnyere Atiku Abubakar jiri kpọọ oku ka ụlọọrụ ndị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ EFCC na ICPC na ndị ọzọ mee nnyocha gbasara ebubo ahụ.

Atiku kwuru na pasenti abụọ n'ego a akpụ n'ọnụ pụtara ihe ruru tarị naịra asatọ na ụma asatọ (N8.8tr), bụ nke a sị gọọmenti mefuru na-enwetaghị nkwado.

N'okwu nke ya, Peter Obi kpọrọ oku ka Onyeisiala Tinubu gbaa arụkwaghịm, dịka ọ sịrị na gọọmenti ya akụọla afọ n'ala inye ezi ngụkọ, ịhụ maka ọdịmma obodo na iwete nchekwa. Ọ gbakwara ndị Naịjirịa ume ka ha gaa n'ihu na-akpọ oku maka nkwụwaakaọtọ n'ụzọ gọọmenti si emefu ego ọha.

Ụfọdụ na-ajụ ihe bụ "off-budget spending"

Off-budget spending pụtara ego mmadụ maọbụ gọọmenti nwereike imefu, nke na-anọghị n'atụmatụ mkpata na mmefu ego nke Ụlọomeiwu kwadoro. Otu dị iche iche gụnyere IMF na ndị ndu otu ndị na-ama gọọmenti aka na-akatọ ya maka na ọ naghị agabiga usoro e ji akwado atụmatụ mkpata na mmefu ego.