Gịnị na-ebute oke ọdachị na njem ụgbọmmiri na Naịjirịa?

Aha onyonyo, Gịnị na-ebute oke ọdachị na njem ụgbọmmiri na Naịjirịa?
Gịnị na-ebute oke ọdachị na njem ụgbọmmiri na Naịjirịa?
    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
  • Mgbe e biputara ya

Gịnị na-ebute oke ọdachị na njem ụgbọmmiri na Naịjirịa? Nke a so n'ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ dịka ihe karịrị mmadụ iri anọ nwụrụ n'ụgbọmmriri kpuru na Sokoto steeti.

N'abalị iri abụọ nke ọnwa Ọgọst 2026 ka ndị uweojii kwuru na ọ bụ eziokwu na ihe mbere ahụ mere.

Ha kwuru na mmadụ iri asaa na asaa so na-eme njem mgbe ụgbọmmiriahụ ha kpuru, mana mmadụ iri anọ na isii nwụrụ n'ihe mberede ahụ.

Ha sị na nke a mere n'ebe a na-akpọ Gorau dị n'okpuruọchị Goronyo dị na Sokoto steeti ma kwuo na mmadụ iri na isii gbanarịrị ọnwụ, mana ahụbeghị mmadụ iri na ise ndị ọzọ.

Ha sị na ọ bụ ụmụaka na ụmụnwaanyị ka ihe ọdachi ahụ kachasị metụta.

Lee ebe udiri ọdachị a mere nsonso a!

E wepụ ndị a mwụrụ na Sokoto steeti, naanị n'afọ a mmadụ iri ise na ise anwụọla n'ihe mberede ụgbọmmiri na Naịjirịa.

Ebe ihe ndị a mere gunyere Jigawa steeti, Kebbi steeti nakwa n'ebe oshimiri 'River Benue'.

Bido na Janụwarị 2023 ruo Ọktoba 2025 mmadụ ruru narị asatọ na iri isii (860) anwụọla maka ihe mberede ụgbọmmiri na Naịjirịa.

Ihe na-ebute nke a na usoro ibeleta ya

Nnyocha na-egosi na ọ bụ ụgbọmmiri ibu ndị njem karịa ole o kwesiri ibu. Ụgbọmmiri na-adịghị mma.

A naghị eso usoro e ji akwọ ụgbọmmiri nakwa adịghị erubeisi n'iyi uwe nchekwa ndụ bekee kpọrọ 'life jacket'.

Abdulbaq Balogun, bụ onyeisi ụlọọrụ 'Lagos Ferry Services' kọwara ihe ga-enyereka beleta ihe mberede na njem ụgbọmmiri.

Ọ sị na ha gunyere:

  • Ime ka ezigbo ụgbọmmiri dị,
  • Iwete ụgbọmmiri ọhụrụ,
  • Ime ka ndị mmadụ na-eyi uwenchekwa ndụ bekee kpọrọ 'life jacket',
  • Ikpochasị oshimiri maọbụ ụzọ ụgbọmmiri,
  • Inye ndị na-akwọ ụgbọmmiri ezigbo ọzụzụ ma ime ka ha nwete akụkwọ ikike ịrụ ọrụ.