Gọọmenti Naịjirịa eweela iwe maka ụmụafọ ha abụọ e gburu na Saụt Afrịka
Gọọmenti Naịjirịa akatọọla ogbugbu e gburu ndị Naịjirịa abụọ na mba Saụt Afrịka aha ha bụ Emeka Iroegbu na Musa Joe, ma kpọọ oku ka ndị ọchịchị mba ahụ mee ezigbo nnyocha iji hụ na ndị aka ha dị n'arụ a natara ntaramaahụhụ kwesịịrị ha.
N'ozi Mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka mmekọrịta mba ofesi wepụtara n'ụbọchị Sọnde 5 Julaị 2026, ha gosiri mwute gbasara mwakpo mba Saụt Afrịka na-emekarị ndị Naịjirịa nakwa ndị mbịarambịa bi na mba ha, ma dọo aka na ntị na ọnọdụ ahụ nwereike ime ka mmekọrịta dị n'etiti Naịjirịa na Saụt Afrịka gbaa ụka.
Ọnọdụ a na-abịa dịka Ụlọnnọchiteanya Naịjirịa na Johannesburg kwupụtara na ndị uweojii gburu Emeka Iroegbu na mpaghara Sunnyside dị na Pretoria ebe ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ekperima gburu Musa Joe n'obodo Witbank dị na mpaghara Mpumalanga n'ụbọchị Sọnde 28 Juun 2026.
End of Akụkọ ndị ọzọ yiri nke a
Cheta na ụmụafọ Saụt Afrịka sị na ha chọrọ ịchụpụ ndị mbịarambịa bi na mba ha n'ụzọ iwu na-akwadoghị nyere iwu ka ndị niile akwụkwọ ha na-ezughị ezu pụọrọ ha na mba ha tupu ụbọchị 30 Juun 2026.
Nke a emeela ka Gọọmenti Naịjirịa kpọlata mmadụ 859 bi na mba Saụt Afrịka n'ụzọ njem anọ ndị ha merela, dịka a na-atụkwa anya na ha ga-aga n'ihu ịkpọlata ndị ọzọ nwere mmasị ịlọghachi.



