Ihe anyị ma maka ụlọọrụ adigboroja ọhụrụ ICPC nyochapụtara

Aha onyonyo, Ihe anyị ma maka ụlọọrụ adigboroja ọhụrụ ICPC nyochapụtara
Ihe anyị ma maka ụlọọrụ adigboroja ọhụrụ ICPC nyochapụtara
Mgbe e biputara ya

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu enyela iwu ka a malite inyocha ụlọọrụ gọọmenti adigboroja nke abụọ ụlọọrụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) chọpụtara.

Nke a na-abịa dịka ICPC gbara agba na ha chọpụtara ụlọọrụ gọọmenti adigboroja ọzọ dịka ha na-enyocha ụlọọrọ adigboroja Presidential Foreign Intervention Promotion Council (PFIPC) nke Adeniyi Adeyemi hiwere ma bụrụ onyeisi ya.

Onyeisioche ICPC bụ Adamu Aliyu kwuru na aha National Brands Development and Made in Nigeria Special Project Office ma kọwaa na ụlọọrụ n'ogige ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmenti gọọmenti Naịjirịa.

Aliyu kwuru na otu nwoke aha ya bụ George Buchi Nwabueze bụ onye nọ n'isi ụlọọrụ adigboroja ọhụrụ a chọpụtara.

Aliyu mere ka o doo any ana a malitere ime nnyocha iji chọpụta etu ụlọọrụ adigboroja a si nweta ikike ihiwe ụlọọrụ n'ogige ụlọọrụ gọọmenti ma chọpụtakwa ka e nwere ndị gọọmenti nyeere ha aka nweta ikike ahụ.

Aliyu gara n'ihu kwuo na o doghị anya ka nwaamdị ahụ enwetara ego n'aka gọọmenti site na nhiwe ụlọọrụ adigboroja tupu a chọpụta ya.

ICPC kwuru na ha chọpụtara na ụlọọrụ adigboroja ọhụrụ a, kwuru na ha bụ ụlọọrụ nọ n'okpuru ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmenti Naịjirịa ma kwuo na ọrụ ha bụ ịkwalite akụrụngwa na ihe dị iche iche a na-emepụta na Naịjirịa.

ICPC kọwara na ụlọọrụ adigboroja ọhụrụ a nwere onye bụ onyeisi ha ma nwekwaa ndịisi na mpaghara zone atọ na Naịjirịa ma nwee ndịisi na steeti iri abụọ na Naịjirịa.

Ha nwekwara ndị na-anọchiteanya ha n amba Amerịka nakwa na Chaịna.

ICPC kwuru na ụlọọrụ National Brands Development and Made in Nigeria Special Project Office na-akwado ime mmemme ngosi ngwaahịa bekee kpọrọ 'exposition' n'Abia steeti nakwa n'Anambra steeti n'ọnwa Septemba na Disemba 2026.

Ka ọ dị ugbua, Onyeisiala Bola Tinubu nyere iwu ka a nwụchie George Buchi Nwabueze ma kwụsịtụ ndị ọbụla a chọpụtara aha dịka nnyocha ka na-aga n'ihu ọrụ.