Ihe Uche Kanu sara dịka akụkọ na-efegharị na-ebo ya ebubo na ọ gbaala Nnamdi Kanu alụkwaghịm

Ebe foto si, Uche Okwu-Kanu/Facebook
Nwunye Nnamdi Kanu, onye ndu otu nnwereonwe a kpọrọ, 'Indigenous People of Biafịa (Ipob) bụ Uche Okwu-Kanu ekwuola na-akụkọ na-ekwu na ya agbaala Nnamdi Kanu akwụkwọ alụkwaghịm bụ akụkọ ụgha.
Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ Sokoto dịka ụlọikpe mara ya ikpe ma tụọ ya nga mkpụrụ ọka n'ebubo metụtara ịkpa nkata ịkwatu Gọọmentị na iyi ọha egwu.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na nwunye Kanu agbaala ya alụkwaghịm maka ebubo ịgba n'ezi.
Mana n'ozi mgbasaozi nke Okwu-Kanu binyere aka ma wepụta n'akara ọbaozi ya na Facebook, n'ụbọchị Fraide, abalị iri nke ọnwa Julaị afọ 2026, o kwuru na ya bụ akụkọ bụ okwu 'ụgha.

Ebe foto si, Uche Okwu-Kanu
Ozi ahụ sịrị, "Anya m erutela akụkọ na-efegharị na soshal midia nke kwuru na m agbaala di m bụ Mazị Nnamdi Kanu akwụkwọ alụkwaghịm."
" Nke bụ eziokwu bụ na agbaghị m akwụkwọ alụkwaghịm ahụ, ihe ha na-ekwu bụ okwu ụgha."
Okwu-Kanu tụrụ arịrị sị, "Ọ dị nnukwu mwute na ndị mmadụ gara n'ihu na-ekonukọ akụkọ banyere ezinaụlọ m na-agbaghị mbọ ịnụta nke bụ eziokwu."
Ọ sịrị na ịgbasa akụkọ ụgha agaghị aba uru ọbụla kama ọ ga-edufu ndị mmadụ.
Cheta na Nnamdi Kanu lụrụ nwunye ya bụ Uchechi Kanu n'afọ 2009. Ha abụọ mụkwara ụmụaka.
































