Dolly Parton: Etu Amerịka na mba ụwa niile si eru uju ọnwụ ya

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mmadụ n'ụwa gụnyere ndị a ma ama, amalitela iwepụta ozi banyere ọnwụ otiegwu Dolly parton nwụrụ site n'ọrịa kansa n'ụbọchị Tuzde 25 Ọgọst, 2026.
Ndị a ma ama gụnyere otiegwu Beyonce, Taylor Swift, Oprah wepụtara ozi dị cihe iche ma kọwaa Parton dịka onye wetara ezi mgbanwe n'ụwa site n'eguw ya ma kwuo na ọnwụ ya dị oke mwute.
Katy Perry kwuru na obi gbawara ya oge ọ nụrụ maka ọnwụ Dolly parton onye ọ kọwara dịka onye dị mma ilegara anya.
Kate Hudson, Gwen Stefani kwupụtara obi mgbawa ha n'ọnwụ Dolly Parton. Ha kwuru na Parton chawapụrụ dịka ọkụ ma kwuo na ha ga-echeta ya oge niile.
Ọtụtụ ndị nkwado hụrụ Parton n'anya tọgbọrọ okooko n'ebe kpakpando 'Hall of Fame' Parton dị.
Onyeisiala Donald Trump mba Amerịka kọwara Parton dịka otiegwu pụrụiche ma nye iwu ka ọkọlọtọ mba Amerịka dịrị n'ụkara n'ebe niile n'Amerịka iji kwanyere Parton ugwu.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka akụkọ ọnwụ otiegwu Dolly Parton fesara ebe niile n'ụbọchị Tuzde 25 Ọgọst, 2026, ọtụtụ mmadụ ekwuola na ha ga-echeta ya dịka onye egwu ya gbanwee ndụ nde kwuru nde mmadụ n'ụwa niile gbaa gburugburu.
Ụfọdụ egwu ya gụnyere Coat of Many Colors, Jolene na I will Always Love You.
Dolly Parton tiri egwu ihe ruru afọ iri asaa (70) ritere onyinye Grammy iri (10), ree egwu ruru otu nde narị (100m) ma dee egwu karịrị puku atọ (3,000).
Parton ji ide egwu kpọrọ ihe ma hụta onwe ya dịka onye na-ede egwu karịa ihe ndị ọzọ niile ọ na-eme.
"Ide egwu bụ etu m si akọwa onwe m, ọ bụ ihe na-enye m ọgwụgwụ," ka Parto kwuru.
Ọ bụ onye ji ego achụego na-anaghị atụ egwu ime ihe ọbụla.
Ọ bụ onye nọ n'isi ihe eguw ya ruo ihe karịrị afọ iri isii (60).
Mana onye bụ Dolly Parton?

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
A mụrụ Dolly Rebecca Parton n'afọ 1946. Ọ bụ nwa nke anọ (4) n'ime ụmụaka iri na abụọ (12). Nne n anna ya bụ ọrụ ugbo dara ogbenye bi n'out imeụlọ dị na Tennessee.
Nna ya, Robert Lee Parton bụ onye ọrụ ugbo na-akọ tobacoo.
Nne ya, Avie Lee, bụ otiegwu na-agụ egwu 'folk' oge niile ebe nwanne nne ya na-akpọ ụbọ akwara ma na-edekwa egwu.
Oge Parton malitere iti egwu dịka nwatakịrị, nwanne nna ya, Bill Owens, na-akpọrọ ya ụbọ akwara.
Oge ọ dị afọ isii (6), Parton malitere ịgụ egwu n'ụlọụka ebe nna nna ya ochie ụkọchukwu. Oge adịghị anya, Parton malitere ịgụ egwu n'onyonyo TV dịka nwa na-eto eto.
N'afọ 1959, oge Parton dị afọ 13, ya na nwanne nna ya Bill, tiri egwu na Grand Ole Opry dị na Nashville. Ebe a bụ ebe a na-ahụta dịka ogige kachasị n'ihe gbasara 'country'.
O zutere Johnny Cash na nweta onyinye 'encores' atọ.
Oge ọ gụchara ụlọakwụkwọ kọleji n'afọ 1964, Parton kwagara Nashville ebe ọ nọ malite njem egwu. Ọ bụ ebe ahụ ka o zutere di ya bụ Carl Dean n'ụbọchị mbụ ya na Nashville.
Ha lụrụ onwe n'afọ 1966 ma biri dịka di na nwunye ruo oge di ya nwụrụ n'afọ 2025.
Porter Wagoner bụ otiegwu 'country' a ma ama na Nashville, hụrụ egwu Parton n'anya nke ukwu nke mere ka o nye ya ọrụ ka ọ na-eti egwu na mmemme TV ya.
N'oge adịghị anya, ha abụọ tipụtara ọtụtụ egwu nke ndị nkwado ha hụrụ n'anya ma malite iwu ewu dịka ndị a ma ama n'egwu 'country'
Dolly Parton dere egwu Coat of Many Colors n'afọ 1969 nke bụ egwu kọwara etu o si too n'ezinaụlọ nwere oke ịhụnanya n'agbanyeghị na ha dara ogbenye.
Parton na-akpọ ọtụtụ ngwa egwu dị iche iche.
O nwetara nhọpụta onyinye Grammy mbụ n'afọ 1971 maka egwu ya ọ kpọrọ Joshua.
Parton hapụrụ mmemme onyonyo TV Porter Wagoner n'afọ 1974 iji tinye uche ya niile n'egwu ya.
O dere egwu I will Always Love You nke ọtụtụ chere na ọ bụ egwu maka mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n'anya.
Ozi si na webụsaịt Parton kwuru na Wagoner kwuru na o bere akwa oge mbụ ọ nụrụ egwu ahụ ma kwuo na ọ bụ egwu kachasị mma ntị ya nụrụ.
Parton dere egwu ya bụ Jolene n'afọ 1974. O kwuru na di ya anabatachaghị egwu ahụ oge o tipụtara ya.
Parton bụ onye ji ego achụ ego bara ọgaranya. N'afọ 2022, Forbes kwuru na ọ bụ nwaanyị kachasị baa onwe ya ọgaranya n'Amerịka.
O nwere ụlọọrụ na-emepụta nke ya a kpọrọ Dolly Records ma soro nwere Dollywood Company nke ọrụ ha bụ nlekọta ogige e ji eme ihe obi ụtọ nakwa ihe ndị ọzọ.
N'afọ 1986, o mwpere igige egwuregwu ya ọ kpọrọ Dollywood amusement park na mpaghara Smoky Mountains.































