Nwunye m abịaghị emume nkwa alụmdi m meere ya – Apama

Aha onyonyo, Nwunye m abịaghị emume nkwa alụmdi m meere ya – Apama
Nwunye m abịaghị emume nkwa alụmdi m meere ya – Apama
    • Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Onye na-eme ihe ejije, ihe ịkpaọchị nakwa kọntent a ma ama bụ Dike Osinachi onye e ji Apama mara agbaala n’anwụ na nwunye ya abịaghị emume nkwa alụmdi bekee na-akpọ engagement o meere ya oge ọ chọrọ ịlụ ya.

Apama kwuru nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka n’Owerri isiobodo Imo steeti ma kọwaa na ụbọchị ihe ahụ mere atọghị ọchị ma ncha.

N’okwu ya, “Azụrụ mgbanaka ‘ring’, kwadoro ihe niile ụbọchị ahụ, kpọọ ọtụtụ mmadụ, zụọ mmanya, nri nakwa ihe ndị ọzọ, mana nwunye abịaghị mmemme engagement ahụ. Oge m kpọrọ ya n’ekwentị, ọ jụrụ ma na ọ bụ etu a ka e si alụ nwaanyị ma gwa m bịa hụ ndị be ha ma ọ bụrụ na achọrọ ịlụ ya”.

Apama gara n’ihu kwuo na ọ gara hụ ndị be nwunye ya ma mee ihe ndị o kwesịrị ime tupu ọ lụ ya.

Banyere etu njem ya dịka onye na-eme kọntent, Apama kwuru na na mbụ, nwunye ya abụghị onye hụrụ kamera n'anya ma ncha.

Mana ugbua, ọ hụla na ọ bụ site na kọntent ka di ya si enweta ego, ọ bụ ya mere o ji malite iso ya eme kọntent.

Ọ kọwara na dịka onye na-eme kọntent, ọ dị mkpa ka ị ghara ị na-ele anya n'ozi ụfọdụ ndị mmadụ na-ezitere gị n'ihu akwụkwọ ma kwuo na soshal midịa abụghị ebe udo kama na ọ bụ ebe a na-adọ mmadụ vam vam vam.

Anyị jụrụ Apama ihe ọ kara ị na-eme ma ọ bụrụ na ọ naghị eme ejije maọbụ kọntent.

O kwuru na "ọ bụrụ na anaghị eme ihe ịkpaọchị taa, nnukwu mmiri kakwara izo na ndụ m. Ajụjụ a siri ike. Echebeghị m ihe m ga-eme ma ọ bụrụ na anaghị eme ihe ịkpaọchị taa. Ọ bụrụ na anaghị eme ihe ịkpaọchị, aga m na-ebugahrị asambodo m nwetara na mahadum na-achọ ebe a ga-enye m ọrụ, oge ọbụla m nwetere, enwere m ya ọbụrụ na m enwetaghị, amalite m ọrụ POS", ka ọ gwara anyị.

Apama mere ka o doo anya na ọ hụrụ ezinaụlọ ya n'anya n'agbanyeghị na ha na-eme kọntent. O kwuru na "Mana na kọntent ọbụla, ezinaụlọ m bụ ezinaụlọ m. E nwere ebe akara dị. E nwere kọntent, e nwere ezinaụlọ. E nwere kọntent, e nwere alụmdi na nwunye. E nwere kọntent, e nwere etu onye si ebi ndụ ya".