Ntuliaka Osun Steeti: Gọvanọ Ademola Adeleke atụọla vootu ya

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Facebook
Gọvanọ Osun Steeti bụ Ademola Adeleke atụọla vootu ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ na-aga n'ihu na steeti ahụ.
Gọvanọ Ademola Adeleke na nwunye ya tụrụ vootu ha n'obodo ya dị n'Ede.
A malitela ntuliaka ọkwa Gọvanọ Osun steeti

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Facebook
A malitela ime ntuliaka ọkwa Gọvanọ Osun steeti n'okpuru ọchịchị iri atọ (30) dị na steeti ahụ taa bụ Satọde 15 Ọgọst, 2026.
Ụlọọrụ Inec kwuru na ha e ji igwe Bimodal Voter Accreditation System (BVAS) dị 5,130 eme ntuliaka a. Nke a dị iche na ntuliaka ikpeazụ e mere na steeti ahụ nke ọ bụ igwe BVAS dị 4,427 ka e ji mee ya
Ọnụọgụgụ ndị debanyere aha ha ịtụ vootu bụ 2,339,233 n'ogige 3,763 dị na wọọdụ 332 nke steeti ahụ.
Ihe mere e ji eme ntuliaka a ugbua bụ maka na n'afọ 2007, ụlọikpe kagburu ntuliaka họpụtara Gọvanọ Olagunsoye Oyinlola n'agbanyeghị na ọ nọọla n'ọkwa afọ atọ ma tinye Rauf Aregbesola dịka Gọvanọ.
Ha malitere ịgụ oge Gọvanọ steeti ahụ n'ụbọchị Rauf Aregbesola banyere n'ọkwa.
Ọ bụ nke a mere oge e ji eme ntuliaka ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ ji dị iche na steeti ndị ọzọ.
Pati ndọrọndọrọ ọchịchị 14 wepụtara mmadụ 14 ga-azọrọ ha ọkwa na ntuliaka a.
Onye ji ọkwa Gọvanọ bụ Ademola Adeleke nke Accord pati, Bola Oyebamiji nke pati All Progressive Congress (APC) na Najeem Folasayo Salaam nke pati di African Democratic Congress (ADC) nakwa ndị ọzọ.
































