Kedụ ndị ọ bụ ọrụ ha ịchọpụta mịnịstrị adịgboroja na Naịjirịa?

Aha onyonyo, Kedụ ndị ọ bụ ọrụ ha ịchọpụta mịnịstrị adịgboroja na Naịjirịa?
Kedụ ndị ọ bụ ọrụ ha ịchọpụta mịnịstrị adịgboroja na Naịjirịa?
Mgbe e biputara ya

Ndị ọrụ nchekwa anwụchiela onyeisi ụlọọrụ gọọmenti adịgboroja dịka ụlọikpe nyere iwu ka a nwụchie ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Osun steeti bụ Abiodun Ojelabi, gwara BBC na a nwụchiri Adeniyi Adeyemi n'Osun steeti mana ọ gwaghị anyị etu e si chọpụta na Adeyemi nọ na steeti ahụ tupu a nwụchie ya.

Mana kedụ ndị ọ bụ ọrụ ha ịchọpụta Mịnịstrị adịgboroja na Naịjirịa?

Nke mbụ bụ Obi ọchịchị onyeisiala: Ọ bụ ha na-arụ ọrụ dịka ndị na-ekpughe ụlọọrụ ndị gọọmenti na-enyeghị ikike, site n'iji aha onyeisiala.

Ọzọkwa Bọjeti Naịjirịa si obi Onyeisiala apụta.

Ajụjụ wee bụrụ, kedụ ka ụlọọrụ adigboroja jiri banye na Bọjeti 2026, na-enweghị onye hụrụ ya?

Nke abụọ bụ Ụlọomeiwu Etiti, maka na ha na-eleba anya n'atụmatụ mkpata na mmefu ego Bekee kpọrọ bọjet.

Ọ bụ na ha ahụghị ego ekenyere ụlọọrụ Presidential Foreign Intervention Promotion Council (PFIPC)

Ọ bụ ha kwesịrị ịna-anụtakwa ucheobi ọhanaeze iji jụọ ezigbo ese e ji achọpụta ụlọọrụ adịgboroja ndị e denyere aha ha maka iketa ego n'akpaego gọọmenti.

Ministri na-ahụ maka Ego nwekwara ụta nke ha maka na ha bụ ụlọọrụ na-agbakọcha ego na bọjeti.

Ụlọọrụ bọjeeti nke na-achịkọta ma na-elekọta atụmatụ mkpata na mmefu ego, nọ n'okpuru Ministri mkpata na mmefu ego.

Ọkaikpe Umar kwuru na nke a ga-eme ya ugboro abụọ Adeyemi dara mba ịbịa ụlọikpe iji zara ọnụ ya n'ebubo ahụ gọọmenti Naịjirịa boro ya.

Nnwuchi Adeniyi Adeyemi onye kpọrọ onwe ya onyeisi ụlọọrụ Presidential Foreign Intervention Promotion Council (PFIPC) na-abịa dịka Ọkaikpe Mohammed Umar nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja nyere iwu n'ụbọchị Tuzde 14 Julaị, 2026 ka a nwụchie ya.

Cheta na n'oge gara aga, Onyeisiala Bola Tinubu nyere iwu ka ụlọọrụ ICPC bụ ndị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ka ha mee ezigbo nnyocha n'ime ụbọchị iri atọ gbasara ụlọọrụ Adeyemi hibere.

Bayo Onanuga, onye na-ekwuru Onyeisiala Tinubu bụ onye kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'akara X.

Dịka ozi ahụ si kwuo, Onyeisiala Tinubu kwuru na a ga-enyocha etu ụlọọrụ ahụ si malite iji akwụkwọ gọọmenti adịgboroja na-arụ ọrụ, usoro gọọmenti siri nabata ha ma na-enye ha nkwado, ọbaego ndị ha mepere, ebe ha si enweta ego nakwa etu ha si emefu ego, ntụnye oke ọbụla si n'aka onye ji ọkwa ọchịchị, mmadụ nkịtị, ụlọakụ maọbụ ndị ọbụla kwadoro ụlọọrụ ahụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ.

Onyeisiala Tinubu nyekwara ntuziaka ka ICPC chọpụta ịda mba gọọmenti nakwa usoro ụlọọrụ gọọmenti dị iche iche ndị e si na ha manye aka enwe n'ofe ma mee ngwangwa tụpụta arọ a ga-esi gbochie ya n'ọdịnihu.

Onyeisiala Tinubu nyere ntuziaka ka mịnịstrị, ngalaba gọọmenti, nakwa ụlọọrụ gọọmenti niile nye ICPC ozi niile ha chọrọ mgbe ọbụla ha jiri chọọ ya.

Chetakwa na anyị gwara gị etu e siri chọpụta Adeniyi Adeyemi Matthew onye kwuru na ya bụ onyeisi ụlọọrụ gọọmentị a sị na ọ bụ adịgboroja a kpọrọ,'Presidential Foreign Intervention Promotion Council'.